You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Ndị Imo steeti gbajọrọ ntuliaka n'ihi ọchịchọ mmiri

      • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
      • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

    Dịka ana-atụ voutu ịji họpụta govano na ndị ga-anọchị ọche omeịwu na bayelsa, Imo na Kogi steeti Niajịrịa, ahuru ndi mmadu n’Imo ka ha gara ịchọ mmeiri ha ga-eji nyere ndu ha aka.

    Kemgbe abali ole-na-ole, mmiri kọrọ n’Ịmo steeti n’ihi abụbọọrụ ulọorụ na-ahu maka ọku latrik malitere,iji zịkọ iwe ha maka atu esiri wakpo onyeisi ha bụ Joe Ajaero n’izuuka garaaga, n’ime ama egwuregwu Sam Mbakwe Owerri Imo steeti.

    Ọtụtụ ndi bị na Imo tukwasara obi na mmiri ha ji aka ha gbupụta n’ụlọ ha, n’ihi ọku latrik nadịghị, kemgbe otu ịzuụka ha enweghị ịke i mịpụtara onwe ha mmiri.

    Ufodu ndi nwere ego na ego mmanuụgbọala agbanye n’igwe ha ji amipụtara onwe ha mmiri.

    Otutu mmadu kwuru na mmanu ugboala adịla ọnu, osi na #680 ruo #750 n’Imo steeti.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo bụ Chukwunaeme Obiejesi hụru ọtutu ndi mmadu ka ha kwọ eche mmiri n’olulu mmiri dịna otu ụlọoezụmeịke n’ogbe Ikenegbu Owerri Imo steeti.

    Otu nwanyi aha ya bụ Eunice kwuru ‘’na-mbu, anyi na-eku mmiri gallon 25 litre #10 na #20 mana ụgbua ọbụ #50 ka anyi na-eku zi ya.’’

    Ọ rịorọ otu na-ahu maka ndiọru ka ha lebanye anya na-ahuhu ndi mmadu na- ata n’Imo steeti ma kwụsị abubọọru ha gbara. Otu nwoke ịwe na-ewe ekweghị agwa anyị aha ya, naani ihe o kwuru bụ na ya amaghị mgbe ya ga-ahụ mmiri ma jee tụọ vọutụ taa.

    ’'O foro obere ihe ka ọkuọ elekere ịrị’’ o kwuru nke a na-iwe. ’’asa beghị m ahu, olee mgbe m ga-ahụ mmiri ga-ezuru mu na ezinaụlo m ma je tuọ vọutu taa?’’.

    ‘’Ọzọ dịka ibeya, kedu uru anyi na erete n’vootu ndi a anyi na-atu dịka obodo n’afo nile anyi tuọla vọutu?’’ ọ jụru.

    Onwe beghị ịhe Gọọmetị Imo steeti kwuru banyere ọku na mmiri na-dighị n’Imo steeti, n’otu mparitaụka Govano Imo steeti bụ Hope Uzodimma na ulọakukọ Channels TV mere, o kwuru na ọ weghị ihe na esere ya na otu na-ahu maka ọrụ.

    Na ya ejighị ndị ọru na ndi lara ezumeịkenka ugwọ ọbula n’Imo steeti, Uzodimma kwuru na ọ na-akwọ ha ugwọ mgbe kwesiri.

    O kwuru na ọburu na ndi ọrụ gọọmentị etịti na-ewe iwe, ọ bughị ya kwesiri ịza ajuju ya.

    Mara na otu na-ahu maka ndi ọru nke Niajịrịa ga-amalite abụbọọru n’Niajịrịa nile n’ubọchị iri anọ nke owa Nọvemba 2023.

  2. Etu ndị ọrụ nchekwa si ji gwongworo nọchie ụzọ na Kogi steeti

    Ndị ọrụ nchekwa nke Kogi steeti ejirila gwongworo nakwa ụgbọala ukwu dị ichiehc nọchie ụzọ iji kwụsị njem nakwa ngagharị n'ime steeti ahụ.

    Mgbe ndị ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ jụrụ ha ase, ha sị na ha ma ụma were mee nka ma na-ekwu "anyị ma ụma jiri gwongworo nọchie ụzọ, anyị chọghị njem si na steeti banye steeti".

    Nke a pụtara na ndị ntaakụkọ ahụ enweghi ike gagharịa na steeti ahụ nakwa okpuruọchịchị ndị ọzọ ịmata ihe na-eme.

  3. Ndị ji aha APC na Labour Party azọ ọkwa na Bayelsa atụọla vootu

    Onye ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ na Bayelsa Steeti bụ Timipre Sylva atụọla vootu n’ọgbọ ịtụ vootu dị na Dururaku Central Open Sapce Ward 4 nke Okpoama dị n’okpuruọchịchị Brass.

    N’otu aka ahụ onye ji aha Labour Party azọ ọkwa gọvanọ bụ Udengs Eradiri tụkwara vootu nke ya na woodu 10 nke Ekperi Amarata nke steeti ahụ.

  4. Samuel Anyanwu nke PDP e ji 'Samdaddy' maara atụọla vootu

    Samuel Anyanwu ji aha Peoples Democratic Party azọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti atụọla vootu ya n’ụlọakwụkwọ Amaimo Central School dị n’Ikeduru nke steeti ahụ.

  5. Athan Achonu nke Labour Party na nwunye ya atụọla vootu

    Athan Achonu nke ji aha Labour Party azọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti atụọla vootu ya n’obodo ya bụ Umunomo dị n’okpuruọchịchị Ehime Mbano nke steeti ahụ.

    N'otu aka ahụ nwunye ya bụ Aisha Abubakar Achonu so kwa ya n'akụkụ tụọ vootu ya.

  6. Hope Uzodimma atụọla vootu

    Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma atụola vootu ya ugbua.

    Uzodimma tụrụ ya n'ọgbọ ntuliaka dị n'okpuruọchịchị Orlu/Orsu/Oru na steeti ahụ.

    Uzodimma na-azọ ọkwa ya nke ugboro abụọ n'aha otu APC.

  7. Inec amalitela nyocha banyere nrụrụaka na ntuliaka Kogi steeti

    Ngalaba na-elekọta ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC n'ịchafụ ekwuola na ndị isi ọrụ ha amalitela ịnyocha akụkọ na-efegharị maka nruruaka n'ebe akpọrọ Ogoro/Magogo dị na Kogi steeti.

    Inec kwuru nke a dịka ozi kwuru ozi na-ebo ebubo na ndị ọrụ ngalaba ahụ wepụtara akwụkwọ mpụtara nke ederela ihe na ya.

    “Anyị anụla ozi nke na-efegharị na achọpụtara akwụkwọ mpụtara nke ederela ihe na ya kpuchiri ụfọdụ ọgbọ ntuliaka dị na Kogi steeti" ka Inec kwuru.

    Cheta na onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha otu PDP na steeti ahụ bụ Dino Melaye etibuola mkpu na ntuliaka ahụ na-aga ihu n'okpuruọchịchị Ogori Magogo emebiela dịka ndị ọrụ Inec na-eme nrụrụaka.

    Nke a na-abịa dịka otu otu na-ahụ amaka ọdimma ndị mmadụ gwara Inec ha lebanye anya n'akụkọ nrụrụaka na-eme n'ụfọdụ ọgbọ ntuliaka dị na Kogi steeti.

    Yiaga bụ otu ahụ kwuru na ha nwetara ozi na o nwere ụfọdụ akwụkwọ mpụtara nke edere na otu otu ndọrọndọrọ emeriela n'agbanyeghi na emechabeghi ntuliaka.

    Nke a na-eme n'ọgbọ ntuliaka dị na Eni nọ n'okpuruọchịchị Ogori/Magogo.

  8. Gọvanọ Bayelsa steeti bụ Duoye Diri atụola vootu ya

    Aka na-achị Bayelsa steeti bụ Duoye Diri atụọla vootu nke ya n'ọgbọ ntuliaka dị na Kalama-Owei wari dị n'okpuruọchịchị Kolokuma/Opokuma na steeti ahụ.

    Duoye Diri banyere ọkwa ọchịchị dịka o ụlọikpe kpebiri na ọ bụ ya meriri ntuliaka e mere n'ọnwa Nọvemba afọ 2019 ma chụpụ David Lyon nke onye APC n'oche.

    Ọ na-azọ ọkwa a nke abụọ ya n'aha otu PDP.

  9. Ị ma ndị nọ n'isi ọgụ mkpi taa?, Lee aha ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo, Bayelsa na Kogi taata

    N'Imo steeti

    Hope Uzodinma nke All Progressives Congress (APC)

    Athan Achonu nke Labour Party (LP)

    Samuel Anyanwu nke Peoples Democratic Party (PDP)

    Anthony Ejiogu nke All Progressives Grand Alliance (APGA)

    Ben Uche Odunze nke New Nigeria People's Party (NNPP)

    Obinna Bright Ekwebelem nke Social Democratic Party (SDP)

    Jack Ogunewe nke Action Alliance (AA)

    Na Kogi steeti

    Dino Melaye PDP

    Ahmed Usman-Ododo APC

    Murtala Ajaka SDP

    Na Bayelsa steeti ndị na-azọ bụ

    ADC - Kalango Stanley Davies

    ADP - Oguara Nengimonyo

    APC - Timipre Sylva

    APGA - Subiri Waribodei Joseph

    APM - Oshariken Saturday

    APP - Ogege Kemelayefa Mercy

    BP - Ben Victor Magbodo

    LP - Eradiri Udengmobofa

    NNPP - Azebi Bestman Ayabeke

    NRM - Micah Akeems

    PDP - Diri Douye

    PRP - Ozato Erepadei Erepadei

    SDP - Osuluku Binalayefa

    Zenith Labour Party (ZLP) - Simeon Imomotimi Karioku

  10. Ndị agha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ nọsi ike na Kogi

    Ndị agha nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ kwụ chịm na Lokoja bụ isiobodo Kogi steeti dịka mmachi ngagharị maka ntuliaka na-aga n'ihu.

    BBC chọpụtara na n'agbanyeghị na ebe niile dara jụụ, o nwerekwere ka ihe si kwụrụ.

    Gbado anya ebe a maka akụkọ ndị ọzọ si ebe ahụ apụta.

  11. Ntuliaka amalitela n'uju n'Imo, Kogi na Bayelsa

    Ndị mbụ pụtara ime ntuliaka atụola vootu ha n'Ikenegbu dị n'Imo steeti na Kogi nakwa Bayelsa steeti.

    Lee ka o si aga

  12. Ụtụtụ ọma nu o!!!!, Udo diri unu niile!

    Taata bụ ụbọchị ntuliaka Imo, Kogi na Bayelsa soro anyị ka anyị na-enye unu akụkọ gbasara ihe niile na-akpọtụ ebe ndị a

  13. Etu ụmụafọ Imo Steeti si ata ahụhụ n'ihi enweghi ọkụ latrik kamgbe NLC gbara abụbụọrụ

  14. Onye ọbụla chọrọ ibute ọgbaaghara na ntuliaka Imo steeti, ga-ahụ ihe o mere onwe ya - Ndị uweojii

    Onyeisi ndị uweojii na-ahụ maka nchekwa na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti bụ Frank Mbah, ekwela nkwa nchekwa zuru oke n'oge ntuliaka ahụ.

    Mbah kwere nkwa a dịka ọ na-agwa ndị uweojii okwu n'isi ụlọọrụ ha dị n'Owere n'ụbọchị Fraịde.

    Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha rube isi n'iwu na-achịkọta ntuliaka ahụ ma zeere imenyere onye ọbụla maọbụ imegide onye ọbụla.

    Cheta na onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Kayode Egbetokun kwuru na ha ga-eziga ndị uweojii ọnụọgụgụ ha dị 25,565 maka iweta nchekwa na ntuliaka Imo steeti.

    Nke a gunyere ndị Kọmishọna 15, na Deputy Kọmishọna 29, na ndị Assistant Kọmishọna 40 iji hazie ntuliaka ahụ.

  15. O nweghi mgbe m ji rituru Uzodimma - Samuel "Samdaddy" Anyanwu

    Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'Imo steeti n'aha otu PDP bụ Samuel Nnaemeka Anyanwu ekwuola na o nweghi mgbe o ji riruru Hope Uzodimma bụ Gọvanọ n'ịzọ ọkwa ahụ.

    O kwuru na ihe onyonyo na-efegharị na-ekwu na o mere nke a bụ adigboroja.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Ikenna Onuoha wepụtara, ọ sị "anyị anụla ma hụ otu ihe onyonyo na-efegharị na soshal midi na-ekwu na Samuel Anyanwu a ma dịka Samdaddy akwụsịla ọsọ ịnweta oche Gọvanọ. Ihe onyonyo a bụ adigboroja bu okwu asị na-achọkwa ịkwahie uche ndị mmadụ ma bụrụkwa ihe enweghi isi ."

    Ha tụkwara Gọvanọ Hope Uzodimma aka na ọ ma anya onyonyo ahụ na-efegharị ma na-ekwu na o si ya n'aka.

    "I lee onyonyo ahụ anya ọfụma, ị ga ahụ na ọ bụ aghụghọ rụrụ ya arụ iji mee uche Hope Uzodimma" bụkwa ihe ọzọ ha kwuru.

    O kwuru na Anyanwu kwụsị ike maka ntuliaka ahụ ga-eme n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba ma kwuo na o nweghi mgbe echiche ịwepu onwe ya n'ọsọ oche Gọvanọ ji bata ya uche.

    Anyị na-agba mbọ ịnụrụ olu Hope Uzodimma nakwa otu ya bụ APC gbasara akụkọ a.

  16. Imo Election 2023: Samdaddy, Uzodimma, Athan, Ejiogu na ndị ọzọ na-azọ ọkwa Gọvanọ

  17. Ọ bụghị naanị onye nọbụrụ n’ọchịchị maara ka e si achị obodo – Obinna Ekwebelem

    Onye ji aha Social Democratic Party (SDP) azọ ọkwa Gọvanọ Imo steeti bụ Obinna Bright Ekwebelem akọwaala ebumnuche ya n’ebe ndị Imo steeti nọ.

    Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ekwebelem kwuru na ihe mbụ ọ ga-eme ma o merie ma banye n’ọkwa gọvanọ Imo steeti bụ ihiwe kọmitii ga-ahụ maka ọzụzụ ndị nchekwa n’okpuruọchịchị niile nke steeti ahụ.

    O kwuru na ọ ga-ehiwe ihe a kpọrọ ‘youth hub’ ga-elekọta ndị ntoroọbịa, nye ndị gụrụ akwụkwọ ọrụ ma zụọ ndị agụghị akwụkwọ n’ọrụ aka.

    Ekwebelem bụ nwafọ Okwele nke dị n’okpuruọchịchị Onuimo nke Imo steeti.

    Kirie ihe ndị o kwuru n’uju;

  18. Inec ebidola ikesa akurungwa dị mkpa maka ntuliaka Imo steeti

    Ndị ọrụ Inec n'okpuru ọchịchị dị icheiche n'Imo steeti gbakọrọ n'ụlọọrụ ụlọaku etiti nke Naijiria dị n'Owere iji buru akụrụngwa dị mkpa maka ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-eme n'abalị abụọ na-abia bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba 202

    Ndị ntaakụkọ, ndị otu pati dị icheiche, na ndị na-elekọta etu ntuliaka si aga, a na-akpọ election observers nọcha ebe ahụ iji hụ etu ihe si aga.

    N'okwu ya, onyeisi Inec na-elekọta mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria bụ Kenneth Ukeagu, nakwa onyeisi Inec Imo steeti bụ Sylvia Agu kwekwara nkwa na Inec adịla nnọọ njikere maka ntuliaka nke ụbọchị Satọde, ma kpokuo ndị Pati dị icheiche ka ha rube isi n'usoro niile iji nwee udo na ntuliaka ahụ.

  19. Aga m akwụ ezinaụlọ ndị ojiegbe gburu ụmụ ha n’Imo Steeti ego iti aka n’obi – Ben Uche Odunze

    Ben Uche Odunze ji aha New Nigeria Peoples Party NNPP azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti na ntuliaka a ga-eme n’ụbọchị Satọde 11 Nọvemba ekwuola ihe ọ ga-emere ndị Imo Steeti ma ọ banye n’ọchịchị ahụ.

    Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Odunze kwuru na ọ ga-akwụ ezinaụlọ ọbụla ndị ojiegbe gburu ụmụ ha na ụmụnne ha n’Imo Steeti ego iti aka n’obi.

    O kwuru na ihe kpalitere mmụọ ya ịbanye n’ịzọ ọchịchị bụ maka etu ọnọdụ akaụnaụba, ọnọdụ nchekwa nakwa ihe ndị ọzo dị na steeti ahụ.

    Na e kwesịrị inwe onye ntoroọbịa maara ihe ekwe na-akwụ ma maara uche ndị ntoroọbịa, na ọ bụ ya mere o jiri pụta.

  20. Wepụnụ onyeisi Inec Imo steeti- Ndị pati anọghị n'ọchịchị

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị ịche iche abụghị nke nọ n'ọchịchị n’Imo steetị akpọọla oku ka e wepụ onyeisi ọrụ Inec bụ Sylvia Agu.

    Ha boro Agu ebubo inwe pati ọ kwụnyere na ntụlịaka na-abịa n'abalị 11 nke ọnwa Novemba, afọ 2023.

    Osote onye na-azọ ọkwa gọvano n’okpuru 'Labour Party' bụ Tony Nwulu gwara ndi ntaakụkọ na ebe onyeisi ndi uweojii Naijịrịa wepụrụ komịshọna ndi uweojii n’Imo steeti maka mkpu ndi otu ndọrọndọrọ ọchịchị tiri, na Inec kwesịrị ị wepụ onye nke ha n’Imo steetị dịka ha siri gwa ha.

    O kwuru na INEC nwere ebu m n’obi ị nyere APC aka merịe a ntụlịaka nke ana-akwado ime.

    Osote onye na-azọ ọkwa govano nke PDP bụ Onyereri, kwuru na pati ha ejirila akọ n -uche ha mara na INEC dị njikere i nyere APC aka merie na ntụlịaka nke a na-akwado.

    O kwuru na ihe mere n’Imo steeti n’oge ntụlịaka ọkwa ụlọnnochiteanya agaghị eme-ọzọ.

    Onye na-azọ ọchịchị govano n’okpuru ADP bụ Nwoga kwuru na INEC ejighị eziokwu kwado ntụlịaka ha-na akwado.

    O kwuru sị wepụ REC n’Imo steeti tụpụ ebido ntụlịaka,

    O kwukwara sị Inec wepụta akara igwe BVAS ha chọro iji mee ntụlịaka.

    Nwoga kwuru na ya nwetara ozị na Inec e tinyela akara adigboroja n’ịgwe ha chọro iji mee ntụlịaka iji nyere APC aka merie n’Imo steeti.

    Mana onyeisi APC n’Imo steeti bu Ebere Macdonald gwara ndi ntaakụkọ na ihe nile ahu ndi otu ndọrọndọroọchịchị ndi ọzọ na-ekwu abụghị eziokwu.