Ndị Imo steeti gbajọrọ ntuliaka n'ihi ọchịchọ mmiri
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Dịka ana-atụ voutu ịji họpụta govano na ndị ga-anọchị ọche omeịwu na bayelsa, Imo na Kogi steeti Niajịrịa, ahuru ndi mmadu n’Imo ka ha gara ịchọ mmeiri ha ga-eji nyere ndu ha aka.
Kemgbe abali ole-na-ole, mmiri kọrọ n’Ịmo steeti n’ihi abụbọọrụ ulọorụ na-ahu maka ọku latrik malitere,iji zịkọ iwe ha maka atu esiri wakpo onyeisi ha bụ Joe Ajaero n’izuuka garaaga, n’ime ama egwuregwu Sam Mbakwe Owerri Imo steeti.
Ọtụtụ ndi bị na Imo tukwasara obi na mmiri ha ji aka ha gbupụta n’ụlọ ha, n’ihi ọku latrik nadịghị, kemgbe otu ịzuụka ha enweghị ịke i mịpụtara onwe ha mmiri.
Ufodu ndi nwere ego na ego mmanuụgbọala agbanye n’igwe ha ji amipụtara onwe ha mmiri.
Otutu mmadu kwuru na mmanu ugboala adịla ọnu, osi na #680 ruo #750 n’Imo steeti.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo bụ Chukwunaeme Obiejesi hụru ọtutu ndi mmadu ka ha kwọ eche mmiri n’olulu mmiri dịna otu ụlọoezụmeịke n’ogbe Ikenegbu Owerri Imo steeti.
Otu nwanyi aha ya bụ Eunice kwuru ‘’na-mbu, anyi na-eku mmiri gallon 25 litre #10 na #20 mana ụgbua ọbụ #50 ka anyi na-eku zi ya.’’
Ọ rịorọ otu na-ahu maka ndiọru ka ha lebanye anya na-ahuhu ndi mmadu na- ata n’Imo steeti ma kwụsị abubọọru ha gbara. Otu nwoke ịwe na-ewe ekweghị agwa anyị aha ya, naani ihe o kwuru bụ na ya amaghị mgbe ya ga-ahụ mmiri ma jee tụọ vọutụ taa.
’'O foro obere ihe ka ọkuọ elekere ịrị’’ o kwuru nke a na-iwe. ’’asa beghị m ahu, olee mgbe m ga-ahụ mmiri ga-ezuru mu na ezinaụlo m ma je tuọ vọutu taa?’’.
‘’Ọzọ dịka ibeya, kedu uru anyi na erete n’vootu ndi a anyi na-atu dịka obodo n’afo nile anyi tuọla vọutu?’’ ọ jụru.
Onwe beghị ịhe Gọọmetị Imo steeti kwuru banyere ọku na mmiri na-dighị n’Imo steeti, n’otu mparitaụka Govano Imo steeti bụ Hope Uzodimma na ulọakukọ Channels TV mere, o kwuru na ọ weghị ihe na esere ya na otu na-ahu maka ọrụ.
Na ya ejighị ndị ọru na ndi lara ezumeịkenka ugwọ ọbula n’Imo steeti, Uzodimma kwuru na ọ na-akwọ ha ugwọ mgbe kwesiri.
O kwuru na ọburu na ndi ọrụ gọọmentị etịti na-ewe iwe, ọ bughị ya kwesiri ịza ajuju ya.
Mara na otu na-ahu maka ndi ọru nke Niajịrịa ga-amalite abụbọọru n’Niajịrịa nile n’ubọchị iri anọ nke owa Nọvemba 2023.