You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya
Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo
E butuola onye uweojii n’ọkwa maka ịnapụ ndị mmadụ egọ n’Imo steeti
Kọmịshọna ndị uweojii n’Imo steeti bụ Aboki Danjuma ebutuola Inspector Isong Osudueh n’ọkwa maka ịnapụ ndị mmadụ ego n’ike.
Isong Osudueh bụ onye na-arụbu ọrụ na ngalaba na-ebu agha megide iyi ndụ egwu bụ Counter Terrorism Unit (CTU).
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru nke a n’otu ozi o zipụrụ n’ụbọchị Tuzde 28 Mee 2024.
E buturu Osudueh n’ọkwa n’oge ihe onyonyoo gosiri ebe ọ na-anapụ ndị ọkwọụgbọala ego n’okporoụzọ sitere Owerri gawa Ọnịcha.
Dịka Okoye siri kwuo, Danjuma katọrọ omume onye uweojii ahụ ma kwuo na ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti agaghị anabata ụdị omume ọjọọ ọbụla n’ebe ndị uweojii nọ.
Burkina Faso ewerela afọ ise gbatịa oge ọchịchị ndịagha
Ọchịchị ndịagha Burkina Faso amaala ọkwa na ha ga-eji afọ ise gbatịa oge ọchịchị ha.
E kwupụtara nke a n’ụbọchị Satọde n’oge e nwechara nzukọ mkpọtụrụ mba ahụ n’isi obodo ya bụ Ouagadougou.
Ụlọ mgbasaozi Burkina Faso mere ka anyị mata nke a.
Onyeagha na-achị mba ahụ bụ Kaptịn Ibrahim Traoré ga-enwekwa ohere isoro zọọ ọkwa onyeisiala a ga-ahazi na ngwụcha afọ ise ahụ.
Dịka o siri kwuo, nkwekọrịta ọhụrụ nke Kaptịn Traoré bịanyere aka na ya kwuru na oge nnyefe ọchịchị ahụ bụ ọnwa iri isii ga-amalite n’abalị abụọ nke ọnwa Julaị, afọ a.
N’oge o weghaara ọchịchị ihe dịka afọ abụọ gara aga, Kaptịn Traoré kwere nkwa iweghachi ọchịchị ndị nkịtị n’abalị mbụ nke ọnwa Julaị, afọ a.
Mana ka ọ dị ugbua, Burkina Faso esonyerela ndị agbataobi ya bụ Mali n’ịgbatikwu oge ọchịchị ndịagha.
Burkina Faso nọ n’okpuru ọchịchị ndịagha kemgbe ọnwa Jenụwarị 2022 bụ mgbe Lt Col Paul-Henri Damiba napụrụ onyeisiala mba ahụ bụ Roch Kaboré ọchịchị n’ike.
Anyị achụọla Julius Abure dịka onyeisioche – Labour Pati nke Edo steeti; Ọ bụghị eziokwu – Isi ụlọọrụ Labour pati
Ngalaba Labour Pati n’Edo steeti na-ekwu na ya achụọla Julius Abure dịka onyeisioche otu ahụ na Naịjirịa.
Onyeisioche Labour Pati n’Edo steeti bụ Kelly Ogbaloi kpuhere nke a n’oge ọ na-agụpụta akwụkwọ ozi abụọ e jiri chụpụ Abure n’Arue Ward 3, okpuruọchịchị Esan North East nke steeti ahụ.
Dịka Ogbaloi siri kwuo, ndị isi ọchịchị Labour pati n’Edo steeti enweghị ihe ọzọ ha maara ha ga-eme karịa ịnabata mkpebi Arue Ward 3, Uromi, okpuruọchịchị Esan North East nke Edo steeti.
Mana ka osiladị, n’ozi Labour Pati bipụtara n’ọbaozi ya n’ụbọchị Satọde 25 Mee 2024, ha kọwara akụkọ ahụ na-ekwu na achụọla Abure na Ward 3, Arue, Utomi, Esan North East nke Edo steeti dịka okwu ụgha.
Dịka odeakwukwo mgbasaozi otu ahụ na Naịjirịa bụ Obiorah Ifoh siri kwuo, iwu otu ahụ kwuru na ọ bụ naanị nnukwu ogbakọ otu Labour nke ụzọ abụọ n’ime atọ ya kwetara ka achụpụ onyeisi ya ga-enwe ike ime nke ahụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na wọọdụ, okpuruọchịchị maọbụ steeti enweghị ikikere ọbụla n’okpuru iwu ịchụpụ onyeisioche otu ahụ.
Red Cross Orphanage: Gọọmentị Enugwu enyela ụmụaka ndị a ọnọdụ ọhụru ka akụkọ BBC pụtachara
Hope Uzodimma agaala leta ndị nwere ihe mberede n’Imo steeti
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma agaala leta ndị zutere ihe mberede n’okporoụzọ IMSU Junction n’ụbọchị Satọde gara aga.
Ọ bụ n’ụbọchị Mọnde 20 Mee 2024 ka Uzodimma gara leta ndị ahụ nwere ihe mberede okporoụzọ n’ebe ha na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ Federal University Teaching Hospital Owerri (FUTHO).
N’oge ọ na-ekwu okwu, onye nọchitere anya Gọvanọ Uzodimma na njem ahụ bụ osote ya, Chinyere Ekomaru, kwuru na gọvanọ enyela iwu ka e mee nnyocha iji chọpụta ihe butere ọdachị ahụ.
Ọ makwara ọkwa na gọọmenti Imo ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ mmadụ niile nwetara ihe mmerụahụ n’ihe mberede ahụ.
N’oge ya na ndị ahụ nwere ihe mberede na-akparịtaụka, Ekomaru kpuhere na gọọmenti ga-agbakọorọ ụlọọgwụ ahụ aka iji hụ na ha nwetara onwe ha na-egbughị oge.
Cheta na Gọvanọ Uzodimma ezipụrụla ezinaụlọ ndị tufuru ndị nke ha n’oge ihe mberede ahụ ozi nkasiobi ma kwee nkwa na gọọmenti ya ga-eme ezi nnyocha banyere njinji ahụ.
Mmadụ isii tụfuru ndụ ha ebe ọtụtụ ndị ọzọ nwetara ihe mmerụahụ n’ụbọchị Satọde n’ihe mberede mere n’okporoụzọ IMSU Junction nke dị n’isi obodo Imo steeti bụ Owerri.
Mba dị n' Ọdịda Anyanwụ Afrika otu ezinaụlọ nọ n'ọchịchị kemgbe afọ 60
Ndịagha egbuola ọchịagha IPOB/ESN n’Imo steeti
Ndịagha Naịjirịa nọ n’ọrụ a kpọrọ ‘Udo Ka’ ekposaala ndị omekoome na mpaghara Udda, Ihitteukwa na Orsumoghu dị n’okpuruọchịchị Orsu nke Imo steeti.
Isi ụlọorụ ndịagha Naịjirịa kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 7 Mee 2024 n’ozi ha wepụtaara ọhanaeze n’akara ọbaozi X ha.
Ozi ahụ kwuru na ndị omekoome tụrụ ndịagha ogbuniigwe iji chụghachi ha azụ mana ndịagha guzosiri ike ma gbuo anọ n’ime ha ebe ndị nke ọzọ buuru apa mgbọ gbafuo.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, e gburu otu n’ime ndị ọchịagha IPOB/ESN na-elekọta mpaghara Ihitteukwa bụ Tochukwu e ji ‘Ojoto’ mara, na-agbanyeghị ọtụmọkpọ niile o tinyere n’ahụ.
Ndịagha sịrị na ngwongwo ebupụtara n’ogbe ndị omekoome ahụ gụnyere otu egbe AK-47 nwere eriri mgbọ abụọ, egbe pump action abụọ, igwe redio atọ, otu igwe kọmputa laptop, otu ekwentị, igodo ụgbọala, otu ihe dịka ọgwụike Marijuana, akwụkwọ ego Biafra, mgbọ ogbuniigwe ise, ngwa ndị e ji emepụta mgbọ ogbuniigwe, ọtụmọọkpọ dị iche iche na ihe ndị ọzọ.
Ọchịagha na-ahụ maka Udo Ka bụ Maj. Gen. Hassan Dada gwara ọhanaeze na ndị otu ya na-agbasi mbọ ike iji hụ na ekpochapụrụ ndị omekoome ma weghachi udo na mpaghara ahụ.
Mahamat Deby, onyeisi ndịagha Chad emeriela na ntụliaka onyeisiala
South Africa: Ihe ha tụrụ anya afọ 30 na nnwereonwe ga-ewetara ha o mezuola?
Hope Uzodimma: Iwu Naịjirịa ọ kwadoro Gọvanọ ịhọpụta onwe ya dịka kọmịshọna?
Ihe ndị uweojii kwuru maka nwoke e gburu, dọwa ozu ya n'ama n'Imo steeti
"Ndị PDP Imo steeti niile so Ihedioha aga ebe ọbụla ọ na-aga" - Barr. Kissinger
Etu e si lie Chukwuemeka Ezeife (Okwadike) bụbu Gọvanọ Anambra Steeti
Lee ndị Gọvanọ chiburu ha na EFCC na-agba egwu surugede ugbua
Nnamdi Kanu ekwughị na ọ gaghị apụta maka ikpe ya maọbụrụ na e meghị ihe ọ chọrọ- Ejimakor
Ihe mere n'ikpe EFCC na Cubana Chief Priest taa
Lee etu oliliozu Ogbonnaya Onu si aga n'Ebonyi Steeti
Anwụchiela onye nwe ụlọ oriri maka ịtagbu otu nwaokorobịa n’ahụhụ n’Imo Steeti
Ndị uweojii anwụchiela onye nwe ụlọ oriri ‘Our Guest House’ dị n’Umulogho n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti bụ Maazị Ibe Obasi n’ihi ebubo igbu nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na ise maka izu ohi ekwentị.
Ibe Obasi gbara afọ iri atọ na asatọ bụ onye a na-ebo ebubo igbu Ebuka Udemba, onye Umuokpa dị n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti.
N’oge BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye, ọ kọwara na nnyocha ndị uwojii mere gosiri na nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ bụ onye akpọchiri n’imeụlọ igweọkụ ‘generator’ nke ụlọ oriri ‘Our Guest House’ bụ ebe anwụrụ ọkụ nọọrọ kugbuo ya.
Ọ gara n’ihu kwuo na “enyefeela nwaamadị ahụ a na-enyo enyo n’aka ngalaba ndị uweojii na-eme nnyocha banyere mpụ bụ ‘State Criminal Investigation Department (SCID)’ dị n’Owerri maka ime nnyocha miri emi n’okwu ahụ.’
O kwukwara na nwaadị ahụ enyela ndị uweojii ozi rijuru afọ nke ga-enyere ha aka inwuchi mmadụ ndị ọzọ aka ha dị n’okwu ahụ.
Okoye sịrị na kọmịshọna ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Aboki Danjuma agwala osote onyeisi ya na-ahụ maka SCID ka o mee nnyocha rijuru afọ iji chọpụta ihe butere ọnwụ nwaokorobịa ahụ ma hụkwa na anwụchiri mmadụ niile aka ha dị n’ọnwụ ya.
N’ụbọchị Mọnde 8 Eprel 2024 ka anyị nwetara ozi na otu onye nwe ụlọ oriri jiiri anwụrụ ọkụ si n’igweọkụ 'generator' gbuo otu nwaokorobịa n’ihi ebubo izu ohi ekwentị.
Jacob Zuma enwetala mmeri n’ụlọikpe isoro zọọ ọkwa na ntụliakaelu South Africa
Onyeisiala Saụt Afrịka pụrụ apụ bụ Jacob Zuma enwetala ikike isonye na ntụliakaelu a ga-ahazi na mba ahụ n’ime ọnwa Mee.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe na-ahụ maka ntụliakaelu tụgharịrị mmachi amachiri ya isoro zọọ ọkwa n'oge ntụliakaelu.
N’ime ọnwa gara aga, ụlọọrụ na-ahazi ntụliakaelu na Saụt Afrịka machiri Zuma isonye na ntụliakaelu maka ịgbanahụ amamiikpe ụlọikpe.
Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK).
Dịka onye amabu ama na pati ji ọkwa ọchịchị ugbua na Saụt Afrịka bụ ‘African National Congress’ (ANC), Zuma bụ onye aha ya na-eko achịcha ma bụrụkwa onyeisiala malite n’afọ 2009 ruo 2018 bụ mgbe ọ rịturu n’ọkwa ọchịchị n’ihi ebubo mpụ na nrụrụakaego.
A tụrụ ya mkpọrọ ọnwa iri na ise n’afọ 2021 n’ihi na ọ jụrụ ịgba akaebe n’oge a na-enyocha ya maka mpụ na nrụrụakaego, mana ka osiladị ọ gara mkpọrọ naanị ọnwa atọ n’ihi ọnọdụ ahụike ya.