You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Hage Geingob bụ onyeisiala mba Namibia anwụọla ka ọ gbachara afọ 82

  2. Igwe Neni's suspension: Ihe mere Soludo ji kpọghachi Igwe Damian Ezeani

  3. Insecurity: Ntọrị ụmụaka isii, ogbugbu ndị Eze na ihe ndị na-egosi na nchekwa gba ọtọ na Naịjirịa

  4. Etu ndị ojiegbe si zuo ndị POS ohi aghara aghara ma gbuo ufọdụ n’Imo Steeti

  5. Nnamdi Kanu a chụrụ Mike Ozekhome, Ifeanyi Ejiofor na ndị Okaiwu ya ndị ọzọ? - Lee ihe anyị ma

  6. 'Aga m enweta nnwereonwe m' - Nnamdi Kanu

  7. COP28: Gịnị mere okwu ọnụọgụgụ ndị nọchite anya Naijiria n'ọgbakọ mgbanwe ihu igwe ji akpọtụ?

  8. Etu ndị ojiegbe si gbuo mmadụ aghara aghara n’Imo steeti n’ime izuụka abụọ

  9. A kwụsịtụla ikutu ụlọ ndị mmadụ n'Abule Ado Legọs ma malite inyocha akwụkwọ ha

  10. Hope Uzodimma anatala asambodo mmeri ya

    Gọvanọ na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma anatala asambodo mmeri ya n'aka Inec taa bụ ụbọchị Fraịde n'Owere bụ isi obodo steeti ahụ.

    Uzodimma n'okwu nnabata ya kwuru na ihe Inec mere egosila ndị mmadụ na ha nwereike ịnwe ntụkwasiobi na vootu ha ga-enwe isi.

    O ji ohere ahụ kelee ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec maka ịhazi ntuliaka ọ sị bụ nke kachasị "nwe udo ma nye ohere ma bụrụ nke ziri ezi"

    O kelekwara ndị ọrụ nchekwa maka nkwado ha nyere atụmatụ ntuliaka n'ụbọchị ahụ.

    Cheta na Inec kpọpụtara aha ya dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ Imo steeti e mere n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.

    Ọ ga-achị afọ anọ ọzọ dịka iwu Naịjirịa si nye.

  11. Ọ bụ eziokwu na a hụrụ ozu mmadụ 322 n’otu ili n’Anambra Steeti? Lee ihe anyị ma

  12. Off-cycle elections: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

    Aka na-achị Bayelsa Steeti bụ Douye Diri ekelela Chineke na ndị Bayelsa maka mmeri ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa Steeti e mere n'abalị 11 nke ọnwa Novemba afọ 2023.

    Diri Nke PDP ji vootu dị 175196 merie Timipre Sylva nke APC, onye nwetara vootu dị 110108, ebe Udengs Eradiri nke Labour Party nwetara vootu dị 905.

    N'ozi nke Diri o wepụtara n'akara ọbaọzi ya n'X, ọ sịrị,"Ndị Abịa, ekele m ụnụ."

    Ọ gara n'ihu kwuo sị, Mmeri a a bụ site n'ike nke Chukwu nakwa nkwado ụnụ nyere m iji gbara ụnụ odibo afọ anọ abụọ."

    " Aga m aga n'ihu n'ịbụ gọvanọ mmadụ nile."

  13. Diri emeriela na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa steeti

    Aka na-achi Bayelsa steeti bụ Douye Diri nke PDP emeriela na ntuliaka ọkwa Gọvanọ afọ 2023 nke e mere ụbọchị Satode,abalị 11, nke ọnwa Novemba, afọ 2023, dịka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka bụ Inec si kpọpụta ya taa bụ Monde.

    Gọvanọ Diri, onwe meriri n’Okpuru Ọchịchị isii n’ime asatọ dị na Bayelsa steeti nwetara vootu dị 175196, ebe Timipre Sylva nke APC nwetara vootu dị 110108, ebe Udengs Eradiri nke Labour Party nwetara vootu dị 905.

    Lee ihe ngụkọ na-ekwu

    Ndị debanyere aha: 1056862

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 372090

    Vootu a tụrụ dị mma: 287554

    Vootu ndị agbajọrọ: 3658

    Vootu nnile a tụrụ: 291212

  14. A malitela ngụkọ mpụtara ntuliaka Gọvanọ Bayelsa ọzọ

    Ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naijiria bụ Inec n'ịchafụ amalitela mkpọpụta mpụtara ntuliaka e mere na Bayelsa steeti ụbọchị Satode.

    Inec kwụsiburu mkpọpụta mpụtara si okpuru ọchịchị dị na steeti ahụ Ụbọchịụka dịka ha hiwere nke fọrọ taa bụ Monde abalị 13, nke ọnwa Novemba afọ 2023.

  15. Ahmed Usman Ododo emeriela ntuliaka Kogi steeti

    Ngalaba Inec akpọpụtala aha Ahmed Usman Ododo dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Gọvanọ Kogi steeti.

    Ododo ji vootu 446,237 were rite mmeri a ebe onye so ya n'azụ bụ Muratala Yakubu Ajaka nke SDP ritere vootu 259,052 ebe Dino Melaye nke PDP nwetara 46,362.

    Lee ihe ngụkọ na-ekwu

    Ndị debanyere aha: 1,932,474

    Ndị nwere ikike ịtụ vootu: 794,500

    Vootu a tụrụ dị mma: 782,289

    Vootu ndị agbajọrọ: 9,601

    Vootu nnile a tụrụ: 791,890

  16. A ga-akpọpụga mpụtara ntuliaka Bayelsa n'ụbọchị Monde

    Ngalaba Inec ekwuola na ha ga-akpọchazi mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ Bayelsa steeti echi bụ ụbọchị Monde.

    Ọnụ na-ekwuru Inec na Bayelsa steeti kwuru nke a na mgbede ụbọchị ụka ma kwuo na ha ga-amalite ebe elekere iri na abụọ nke ehihie.

    Nke a mere n'ihi mpụtara ntuliaka nke ha ka na-edekọ n'okpuruọchịchị Brass nakwa ntuliaka emegharịrị n'ụfodụ ebe dị iicheiche na steeti ahụ.

    Ọ kọwakwara na ụfọdụ ebe emere ntuliaka bụ obodo ndị dị n'ikpere mmiri nke mere a ka ji atụ anya na ha ga-erute n'isiobodo Yenogoa n'ụbọchị Monde.

    Okpuruọchịchị ndị akpọpụtara bụ Kolokuma/Opokuma, Ogbia, Yenogoa, Sagbama, Nembe nakwa Ekrermor.

    N'ime ndị a niile, APC meriri n'otu ebe dịka PDP meriri n'ebe ise.

  17. ICPC anwụchiela mmadụ isii zụrụ vootu ndị mmadụ n'Imo steeti

    Ndị ọrụ Independent Corrupt Practices Commission bụ ICPC n'ịchafụ ekwuola na ha anwụchiela mmadụ isii zụrụ vootu mmadụ na ntuliaka e mere n'Imo steeti.

    Ngalaba ahụ depụtara n'akara X (bụbu Twitter) ha na ndị ọrụ ha nwụchiri ndị mmadụ n'ọgbọ ntuliaka asaa ma jichie nde naira anọ.

    Ha sị na otu onye n'ime ndị ha nwụchiri ji akwụkwọ ebe e dere aha nakwa akara ekwentị ndị na-atụ vootu.

    "Ndị niile anyị nwụchiri nọ n'aka anyị ugbua, anyị edetuola aha ha na okwu akaebe ha" ka ha dere.

    Ha sị kwa na ha atọhapụla ndị ahụ nwamgbenta dịka nyocha ka na-aga n'ihu.

  18. Ndị Imo, ụnụ emela- Uzodimma

    Aka na achị Imo steeti bụ Hope Ụzodimma ekelela ndị Imo maka ịkwado ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ steeti ahụ e mere ụbọchị Satode.

    Uzodimma nke APC ji vootu dị 540, 308 merie Sam Anyanwu nke PDP bụ onye nwetara vootu dị 71, 503, ebe Athan Achonu nke otu 'Labour Party' nwetara vootu 64, 081.

    N'ozi ya ụbọchịụka dịka a kpọpụtachara aha ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ nke nyere ya ohere agba nke abụọ, Uzodimma sịrị, " Nkwado pụrụ iche ụnụ nyere m na ntuliak ụnyahụ tụrụ m n'anya."

    "Ntụwasa obi ụnụ nwere n'm ịga n'ihu na edu steeti anyị bụ ihe mkpalite mmụọ.".

    Ọ gara n'ihu kwee nkwa imezu nkwa nile o kwere oge ọ na-achụ nta vootu ma rịọ ndị ya na ya zọkọrọ na ntuliaka ahụ ka ha sonyere ya n'ịkwalite steeti ahụ.

  19. Na Akpọtụ Ugbu A, Anyị ga-agbagha mmeri Uzodimma n'ụlọikpe - Ndị LP nke Imo steeti

    Otu Labour Party n'Imo steeti eforola ntutu taa na ha ga-agbagha mmeri Hope Uzodimma nke APC n'ụlọikpe.

    Onyeisioche otu ahụ n'Imo steeti bụ Callistus Iheagwa kwuru nke a mgbe ọ na-ezi ndị ntaakụkọ ozi dịka akpọpụtachara Hope Uzodimma dịka onye meriri ya bụ ntuliaka ọkwa Gọvanọ.

    Iheagwa kwuru na atụmatụ ntuliaka ahụ juputere na mpụ na nrụrụaka.

    O boro ndị ọrụ nchekwa ebubo na ha nyere ndị ọrụ Inec aka ihu na e mere wayo na ntuliaka ahụ iji mee ka Uzodimma merie.

    Ha sị na mpụtara ntuliaka ahụ nke ezigbo ya gosiri na ọ bụ onye nke ha bụ Athan Achonu meriri ntuliaka ahụ.

    Dịka ọ na gwa ndị ntaakụkọ okwu, Iheagwa sị na ntuliaka ahụ bụ "ohi e zuru n'ehihie nakwa mmetọ ọchịchị onyekwuoucheya"

    Ọ sị na ntuliaka emeghi n'ụfọdụ obodo gụnyere Orsu, Orlu, Ideato North, Okigwe, Oguta nakwa Owerri Munincipal mana Inec gara n'ihu deere ha mpụtara ntuliaka

    Ọ tara onye ọrụ Inec bụ Abayomi Fasina maka egeghị ntị n'okwu ndị a tupu ọ gaa ihu gụkọọ vootu ndị o ji ma kpọpụta Uzodimma dịka onye mmeri.

    Ihejiagwa sị "ihe mere n'Imo steeti bụ adigboroja. Ọ bụ ihe ihere etu ndị ọrụ nchekwa si nye ndị ọrụ Inec na ndị otu APC ohere na nchekwa ịrụrụaka na ntuliaka ahụ".

    Hope Uzodimma onwe ya na-akpọ oku ka ndị o meriri bịa ka ha jikọọ aka bulie Imo steeti.

  20. Lee ka mkpọpụta mpụtara ntuliaka Bayelsa steeti si aga