You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Kedụ ihe mmeri Trump ga-emere mbaụwa?

  2. A họpụtala onye ọkpaọchị dịka Osote Onyeisiala ọhụrụ nke mba Malawi

  3. Ụlọikpe akagbuola nkpọghachị a kpọghachịrị Muhammadu Sanusi n'ọkwa Emir Kano

  4. E duola Cyril Ramaphosa n’iyi ọrụ ugboro abụọ dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka

  5. Fubara edochiela ndịisioche okpuruọchịchị Rivas steeti

    Aka na-achị Rivas steeti ekwuola okwu gbasara ndịisioche okpuruọchịchị steeti ahụ dịka ndị mmadụ na-enwe ụjọ.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ Siminalayi Fubara nọọrọ n’ụtụtụ Tuzde 18 Juun 2024 nye iwu ka ndị isi ọrụ n’okpuruọchịchị niile e nwere na Rivas steeti malite ilekọta okpuruọchịchị ha n’otu n’otu.

    Fubara nyere iwu ahụ n’ozi ọ gbasaara ndị Rivas steeti dịka oge ọchịchị ndịisioche okpuruọchịchị steeti ahụ kụụrụ ọnụ n’ụbọchị Monde 17 Juun 2024.

    O mere mgbasaozi ahụ dịka ụfọdụ ndịisioche jụrụ ịhapụ ọkwa ha, bụ nke mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa gaa nọchie n’ogige ụlọọrụ okpuruọchịchị dị iche iche.

    Ihe kpatara nke a bụ na ụfọdụ ndịisioche siri ọnwụ na ha agaghị ahapụ ọkwa ha n’ihi na onyeisioche ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Martin Amaewhule megharịrị iwu hiwere okpuruọchịchị ma were ọnwa isii gbatịa oge ọrụ ha.

    Ka osiladị, ụlọikpe ukwu dị na Rivas steeti kachapụrụ iwu ahụ ma kwuo na iwu Naịjirịa akwadoghị ya.

    Ọkaikpe Daketima Kio kwupụtara iwu ọhụrụ ahụ nyere ohere ka a gbatịa oge ọrụ ndịisioche a kpọrọ ‘Local Government Law No. 2 of 2024’ dịka nke iwu na-akwadoghị.

  6. Atụmatụ ịzụtara Onyeisiala na osote ya ụgbọelu abụọ gosiri na gọọmenti enweghị mmetụta gbasara ndị ọ na-achị - Peter Obi

    Onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntụliaka 2023 bụ Peter Obi akatọọla atụmatụ ụlọomeiwu na-eme ịzụtara Onyeisiala Bola Tinubu na osote ya bụ Kashim Shettima ụgbọelu ọhụrụ abụọ ma kwuo na nke ahụ gosiri na gọọmenti enweghị mmetụta gbasara ndị ha na-achị.

    Obi depụtara nke a n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 17 Juun 2024.

    O kwuru na mkpebi ahụ bụ nke na-ekwesịghị ekwesị n’ihi ogogo ihe isiike ndị Naịjirịa na-agabiga ugbua tinyere enweghị nchekwa, agụụ, ụbịam ọnụntụ na ikikere naịra na-agba ọnyụpa.

    Obi gara n’ihu kwuo na ihe gọọmenti kwesịrị ime ugbua bụ ịchọta ụzọ a ga-esi belata nhujuanya ụmụ mmadụ ma gboo nsogbu ha karịa ị dị na-ebi ndụ okomoko.

    Peter Obi depụtara ozi ahụ dịka kọmitii ụlọomeiwu nnọchiteanya na-ahụ maka nchekwa obodo gwara Gọọmenti Etiti ka ọ zụta ụgbọelu ọhụrụ abụọ maka Onyeisiala Bola Tinubu na Osote ya bụ Kashim Shettima n’ihi na ndị nke ochie ha nwere etozughị oke ife n’elu.

  7. Otu kọmitii ụlọomeiwu nta ekwuola ka a zụtara Tinubu na Shettima ụgbọelu ọhụrụ

    Kọmitii ụlọomeiwu nnọchiteanya na-ahụ maka nchekwa obodo agwala Gọọmenti Etiti ka ọ zụta ụgbọelu ọhụrụ maka Onyeisiala bụ Bola Tinubu na Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima.

    Nke a dị n’ozi kọmitii ahụ wepụtara n’oge ha mechara nnyocha gbasara ọnọdụ ụgbọelu onyeisiala na osote ya.

    Dịka ha siri dee n’ozi ahụ, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịzụta ụgbọelu abụọ maka onyeisiala na osote ya iji gbochie ihe ọghọm ọbụla nwere ike ịdapụta n’ihi nsogbu ụgbọelu ha nwere.

    N’ime ọnwa Mee, ụlọomeiwu nnọchiteanya nyere kọmitii ahụ iwu ka ha mee nnyocha miri emi gbasara ọnọdụ ụgbọelu dị iche iche onyeisiala ji eme njem iji chọpụta ma ha ka tozuru oke ife n’elu.

  8. Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha

  9. Etu ụlọelu ogogo ise si daa n'ụlọakwụkwọ DMGS dị n'Onitsha, Anambra Steeti

  10. President Tinubu: "Adaghị m ada kama emere m ‘dobale’ iji kwanyere ọchịchị onye kwuo uche ya ugwu"

  11. Enugu steeti: Lee ihe na-esere ECTDA na EEDC

  12. Otti akwụsịtụla kọmishọna na-ahụ maka ahụike ọrụ n’Abịa steeti

    Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti enyela nkwado ka a kwụsitụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dr. Ngozi Okoronkwo ọrụ.

    Nke a dị n’ozi kọmịshọna mgbasaozi Abịa steeti bụ Okey Kanu tinyere aka na ya n’ụbọchị Tuzde 11 Juun 2024.

    Dịka Kanu siri kwuo, nkwụsịtụ ọrụ ahụ bụ iji nye ohere ka e mee kọmịshọna ahụ nnyocha n’ihi ebubo ajọ akparamaagwa e boro ya.

    Ozi ahụ siri na ya bụ mkpebi dabara n’atụmatụ Gọvanọ Otti ịhụ na ndị ahọpụtara n’ọkwa rụrụ ọrụ ha oge niile maka ọdịmma ụmụafọ Abịa.

    Ka o siladị a gwala odeakwụkwọ ukwu nke mịnịstrị ahụịke Abịa steeti bụ Dr. Ifeyinwa Kalu na onye ndụmọdụ pụrụiche gọvanọ n’okwu metụtara ahụike bụ Dr. Ngozi Azodo ka ha na-elekọta mịnịstrị ahụ ruo mgbe e mechara nnyocha gbasara ebubo ahụ e boro Dr. Okoronkwo.

  13. Ndị ojiegbe agbagbuola ndị uweojii abụọ n’Imo steeti

    Ndị ojiegbe amatabeghị ndị ha bụ egbuola ndị uweojii abụọ na otu mmadụ nkịtị n’Akabọ dị n’okpuruọchịchị Ikeduru n’Imo steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwupụtara nke a n’otu ozi o wepụtara n’aha kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma.

    Dịka o siri kwuo, njinji ahụ jiri n’ụtụtụ Tuzde 11 Juun 2024 n’oge ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB na ESN wakporo ebe ndị uweojii na-enyocha ndị mmadụ ma malite ịgba egbe aghara aghara.

    Ọ sịrị na ndị uweojii gbara nnukwu mbọ iguzogide ndị ekperima ahụ mana mmadụ abụọ n’ime ha tụfuru ndụ ha tinyekwara otu onye nkịtị na-agafe agafe.

    O kwuru na kọmịshọna ndị uweojii Imo steeti edurula ndị uweojii gaa n’ogbe ahụ iji were anya ya hụ ka ebe ahụ dị ma nye iwu ka ha gbaa mbọ chọpụta ndị aka ha dị na mwakpo ahụ.

  14. Sịnetọ Ned Nwoko ekwuola ka ekepụta Anịọma steeti n’ime South East

    Onye omeiwu na-anọchiteanya Delta North n’ụlọomeiwu sịnet bụ Ned Nwoko na-ekwu na ya ewepụtala atụmatụ iwu maka ikepụta Anịọma steeti.

    N’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 10 Juun 2024, Sịnetọ Ned Nwoko sịrị na ebumnoobi atụmatụ iwu ahụ bụ idozi ihe e mebiri emebi.

    O kwuru na nkepụta Anịọma steeti dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ ga-enye aka dozie ọnụọgụ steeti na-adịghị nhatanha na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.

    Ọ sịrị na “mpaghara South East nwere naanị steeti ise ebe mpaghara ndị ọzọ nwere steeti isii n’otu n’otu ewezuga mpaghara North West nwere steeti asaa.”

    Dịka Ned Nwoko siri kwuo, ikepụta Anịọma steeti bara nnukwu uru iji hụ na ewetere ikpe nkwụmọọtọ nye ndị South East.

  15. Ndị omeiwu 35 akwadoola atụmatụ iwu maka naanị otu oge ọchịchị

    Ndị omeiwu nnọchiteanya iri atọ na ise ewepụtala atụmatụ iwu iji belata oge ọchịchị onyeisiala na ndị gọvanọ ka ọ bụrụzie naanị afọ isii.

    Iwu ahụ a gụpụtara nke mbụ ya n’ụlọomeiwu nnọchiteanya n’ụbọchị Mọnde 10 Juun 2024 chọrọ ka e megharịa ụkpụrụ iwu Naịjirịa nke afọ 1999 tinyekwara iwu ntụliakaelu nke afọ 2022 iji nyere ọchịchị Naịjirịa na usoro ntụliakaelu aka.

    Ha chọrọ ka amalite ịhazi ntụliakaelu maka ọkwa niile n’otu mkpụrụ ụbọchị, gbasaa okwe ntụliakaelu n’ọbaozi intanet, dozie nsogbu niile metụtara ntụliakaelu imeụlọ tupu ahazie ntụliakaelu ma dozie nsogbu niile metụtara ntụliakaelu tupu eduo ndị nwetara mmeri n’iyi ọrụ.

    Ndị omeiwu ahụ chọkwara ka anabata mpaghara isii e kewara Naịjirịa ma malite ibugharị ọkwa onyeisiala n’ime mpaghara isii ndị ahụ.

    N’ime ndị omeiwu iri atọ na ise kwadoro atụmatụ iwu ahụ bụ Ikenga Imo Ugochinyere, Danga Abdullmaleek, Aliyu Mustapha, Francis Waive na ndị ọzọ.

  16. Etu nwaanyị si gbuo enyi ya nwoke maka ike ego ha nwetara na nwayo

  17. Eduola Narendra Modi n’iyi ọrụ dịka Praịm Mịnịsta India

    Onyendu otu ndọrọndọrọ ọchịchị Hindu Nationalist Bharatiya Janata Party (BJP) bụ Narendra Modi aṅụọla iyi ọrụ maka oge ọchịchị nke atọ dịka Praịm Mịnịsta India.

    A haziri mmemme ahụ n’ebe obibi onyeisiala India dị na Rashtrapati Bhavan.

    Otu Hindu Nationalist Bharatiya Janata Party nke Modi nọ n’isi ya nwetara oche ọchịchị narị abụọ na iri itoli na atọ (293) ebe otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-agba ya ụkwụ nwetara oche ọchịchị narị abụọ na iri atọ na anọ (234).

    N’oge Modi na-ekwu okwu, ọ sịrị na ya “ga-emeta onye niile mma dịka ọ dị n’iwu na-atụghị egwu ihe ọbụla.”

    Onyeisiala India bụ Draupadi Murmu dukwara ndị mịnịsta Mordi n’iyi ọrụ na mmemme ahụ.

  18. Etu otu nwada nọọsụ si nwụọ n’ụlọ enyi ya nwoke n’Imo steeti.

    Otu onye nọọsụ aha ya bụ Ginikachukwu Judith Okoro anwụọla n’ụlọ enyi ya nwoke n’Owerri Imo steeti.

    Ozi anyị nwetara na-ekwu na Gịnịkachukwu gbara afọ 23 bụụrụ onye nọọsụ n’ụlọọgwụ Edoziem Clinic dị n’Awaka okpuruọchịchị Owerri North nke Imo steeti tupu ọnwụ ya.

    N’oge BBC Igbo garuru n’ezinaụlọ Gịnịkachukwu dị n’okporoụzọ Road Safety, Amawire Egbu n’okpuruọchịchị Owerri North nke Imo steeti, nne ya bụ Caroline Iheji kwuru na ọyị nwa ya nwaanyị bụ Charles Chidiebere Ndukwu jiiri ọsọ bịa n’ụlọ ya mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere 2 nke ime abalị gwa ya na nwa ya nwaanyị dara ma nwụọ.

    Dịka o siri kwuo, oge ọ garuru n’ụlọọgwụ e bugara nwa ya, ọ chọpụtara ihe mmerụahụ dị iche iche n’ihu ya nakwa n’azụ isi ya.

    O kwuru na mgbe a jụrụ ya etu nwa ya siri nweta ihe mmerụahụ ndị ahụ, Charles kwuru na ọ bụ n’ihi ihe o tiri ya mgbe ọ na-agba mbọ ịkpọlite ya.

    Caroline Iheji kọwara na Charles Chidiebere Ndukwu, nwaafọ Nkwerre dị n’Imo steeti bụ onye ndị uweojii ji eji ugbua dịka ọ na-akpọ oku ikpe nkwụmọọtọ maka nwa ya nwaanyị nwụrụ anwụ.

    Ka o siladị, n’oge onye ntaakụkọ BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye, ọ zaghị oku ekwenti ya.

  19. Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Onyeisiala Mexico ọhụrụ bụ Claudia Sheinbaum

    ·A mụrụ Sheinbaum n’abalị 24 ọnwa Juun 1962 na mba Mexico

    ·Nna ya bụ Carlos Sheinbaum bụ onye na-azụ ahịa nakwa onye na-ere ọgwu nke nne na nna ya sitere Lithuania bata Mexico n’ime afọ 1920.

    ·Nne ya bụ Annie Pardo bụ onye Dọkịta nakwa onye ‘Biologist’ nke nne na nna ya bụ ndị Sephardic Jew si Bulgaria wuchie n’afọ 1940.

    ·Sheinbaum tolitere n’obodo ndị kpatara ego dị na mpaghara ndịda isi obodo Mexico bụ ebe ọ nọọrọ na-ekwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị oge niile.

    ·Sheinbaum gara akwụkwọ n’otu ụlọakwụkwọ na-akwalite nkwụrụnankeonwe ụmụakwụkwọ bụ nke ejighị mara mba Katolik. Ọ bụ n’ụlọakwụkwọ ahụ ka o nọọrọ wulite akparamaagwa nwaanyị na-eme ihe ike.

    ·Amlo hopụtara Sheinbaum n’ọkwa ma nye ya ọrụ abụọ ndị gụnyere; ịzacha ma kpochaa otu n’ime obodo ndị kachasị nwee ureghure n’ụwa dum tinyekwara ịrụ okporoụzọ Periférico nke abụọ, nke bụ okporoụzọ kachasị buo ibu na mba ahụ. Ọ rụchapụrụ ọrụ abụọ ndị ahụ.

    ·Mgbe ọchịchị Amlo kụụrụ ọnụ n’afọ 2006, Sheinbaum laghachiri n’ọrụ nkụzi ma soro na ndị nwetara onyinye nkwanyeugwu ‘Noble Peace Price’ maka ime nnyocha gbasara mgbanwe ọnọdụ ihu eluigwe.

    ·O tinyekwara aka na ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụ ọnụ na-ekwuru Amlo n’oge achụmtavootu onyeisiala ya kụrụ afọ n’ala n’afọ 2006 nakwa 2012.

    ·N’afọ 2015, ọ banyere na ndọrọndọrọ ọchịchị n’uju dịka ọ zọrọ ọkwa ‘Mayor’ Tlalpan dị na Mexico ma nwetakwa mmeri.

    ·Dịka ọ gasịrị afọ atọ, Amlo nwetara mmerị dịka Onyeisiala mexico ebe Sheinbaum nwetara mmeri dịka onye ‘Mayor’ Mexico City.

    ·N’afọ 2024, Sheinbaum nwetara mmeri dịka Onyeisiala Mexico na-agbanyeghị ọtụtụ nsogbu ndị o zutere.

  20. Abụ njirimara ochie ga-enyere aka jikota obodo Naịjirịa – Sịnatọ Victor Umeh