You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Igbo History: Ndị Igbo sị na ha abụghị Igbo na ihe kpatara ya

  2. Ndị nkwado Donald Trump akatọọla Tim Walz

  3. Gịnị mere egbe ji ada aghara aghara n'Imo steeti?

  4. Kamala Harris na ndị ọzọ nwereike ịnọchi anya Joe Biden n'ịzọ ọkwa Onyeisiala Amerịka

  5. Ugwọọnwa opekatampe N70,000 enweghi ebe ọ ga-eruru anyị - Ndị ọrụ Bekee

  6. Ọ dịzi Gọvanọ Uzodimma n'aka ikpebi ma ọ ga-achụ Ọkaikpe Ukwu Imo Steeti - Ndị omeiwu

  7. A nwụchiela onye a ma ama maka ebubo idina ụmụakwụkwọ FUTO n'ike

  8. Ihe anyị ma maka Thomas Crooks bụ onye nwara igbu Donald Trump

  9. Nnwereonwe Okpuruọchịchị ga-ebupụrụ anyị ibu arụ - Ndị gọvanọ

  10. Onyeisi ndị uweojii na Kenya agbaala arụkwaghịm

  11. Ndị a ma ama na-azọ ọkwa Onyeisiala mba Ghana na ndị osote ha

  12. Nnamdi Kanu ahapụghị okwu nnwereonwe Biafra, ọ ga-agba ụtụ n’ụlọmkpọrọ - Primate Ayodele

  13. Afọ 25 ọchịchị onyekwuoucheya: Kedụ ebe ndị ji ọgbọ n'afọ 1999 nọ ugbua?

  14. Ahọpụtala Massoud Pezeshkian dịka onyeisiala Iran

    Ahọpụtala Massoud Pezeshkian dịka onyeisiala ọhụrụ nke mba Ịran dịka o merichara Saeed Jalili nke otu Conservative.

    Okwe ntụliaka ahụ gosiri na Pezeshkian nwetara pasenti vootu iri ise na atọ na ụma atọ (53.3%) iji merie Jalili nwetara pasenti vootu iri anọ na anọ na ụma atọ (44.3%) nke ọnụọgụ vootu karịrị nde iri atọ (30m) a tụrụ na Ịran.

    A haziri ntụliaka ahụ dịka onye bụbu onyeisiala Iran bụ Ebrahim Raisi nwụrụ na mkpọka ụgbọelu helikọpta n’ime ọnwa Mee.

    Pezeshkian gbara afọ iri asaa na otu (71) bụụrụ dọkịta na-awa obi nakwa onye omeiwu Ịran tupu ahọpụta ya dịka onyeisiala.

    O kwere nkwa na ya ga-eweta udo na ịdịnootu ma hụkwa na Ịran kwụsịrị iwezuga onwe ya iche na mbaụwa.

  15. Ihe mere ndị ndu Ọwụwa Anyanwụ ji akpọ oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu

  16. Nsogbu nchekwa, Nnamdi Kanu na ihe ndị ọzọ Gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpara na nzukọ ha

  17. Ndịagha awakpoola ndị na-eyi ndụ egwu n’Imo steeti, napụta ha ngwaọgụ dị iche iche

    Ndịagha e zipụrụ maka ibu agha megide iyi ndụ egwu n’Imo steeti anwụchiela ndị ndu otu dị iche iche na-eyi ndụ egwu ma napụta ha ngwaọgụ dị iche iche.

    Ụlọorụ ndịagha Naịjirịa kwupụtara nke a n’ozi ha bipụtara n’akara ọbaozi X ha n’ụbọchị Mọnde 1 Julaị 2024.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, ndịagha na otu ọrụ nchekwa ndị ọzọ jikọtara aka wakpoo ogige ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) na ngalaba ndịagha ya bụ Eastern Security Network (ESN) dị n’okpuruọchịchị Orlu n’Imo steeti ma nwụchie ndị ndu ha bụ Izuchukwu Emejuru e ji ‘Kingkong’ mara tinyekwara Chibuzor Chikwe a maara nke ọma dịka ‘Onyema’.

    N’otu aka ahụ, ndịagha wakpokwara ebe mgbazo onye a na-enyo enyo ị bụ onyendụ IPOB/ESN n’Ezeinyen Okwe Umucheke dị n’okpuruọchịchị Onuimo n’Imo steeti bụ Chinemerem, onye a na-etu ‘Bam Bam’.

    Ozi ahụ kwuru na ndịagha gbagburu Chinemerem oge ọ gbara mbọ i buru ngwaọgụ ya ma nwụchie ọtụtụ ndị otu ya.

    Ndịagha kwuru na ha na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB/ESN kwakọrịtara mgbọ n’ebe mgbazo ha dị n’Amausa okpuruọchịchị Okigwe n’Imo steeti nke mere ka ha ghahapụ ngwaọgụ ha dị iche iche rie mbọmbọ.

    Ihe anapụtara ndị ekperima ahụ gụnyere egbe dị iche iche, mgbọegbe, okpu na-acha ndụ ndụ, akpụkpọụkwụ ndịagha na ngwongwo ndị bara oke uru ha napụrụ Eze Ogberuru.

  18. Agha mba Sudan: Anyị na-eri nri naanị otu mgbe kwa ụbọchị

  19. Minimum wage: Ndị gọvanọ agaghị ekpebiri anyị ụgwọọnwa ha ga-akwụ - NLC

    Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) akatọọla okwu ahụ a sị ndị gọvanọ kwuru na steeti ọbụla kwesịrị ikpebi ego ole ha ga-akwụ dịka ụgwọọnwa opekatampe na steeti ha dị iche iche.

    Ndị otu ahụ kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024 n’ozi sitere n’aka onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi ha bụ Benson Upah.

    Dịka Benson Upah siri kwuo, ụdị mkpebi dị etu ahụ bụ nke na-agba ụkwụ megide ebumnoobi e ji nabata ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa.

    O kwukwara na ọ bụ ihe na-agba anyammiri na mgbe ụfọdụ gọọmenti na-ahụta ụgwọọnwa ndị ọrụ dịka ihe ọma a na-emere ha karịa ụgwọọrụ maka nrụsi ọrụ ike.

    NLC gbara onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ume ka ọ hara ikwe ka ụfọdụ ndị gọvanọ na-ebughị ọdịmma Naịjirịa n’obi mee ya ka o chefuo ihe gbasara ụgwọọnwa obibi ndụ o kwere ndị ọrụ na nkwa.

    Cheta na otu e hiwere maka iwepụta ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ kwupụtara puku naịra iri isii na abụọ (N62,000) dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ebe ndị ọrụ gbara isi akwara sị na ha chọrọ narị puku naịra abụọ na iri ise (N250,000).

  20. Ndị ojiegbe agbagbuola mmadụ isii na mpaghara Garki dị n’Okigwe, Imo Steeti