Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Uzodimma, Achonu, ndị ọzọ abịaghị ọgbakọ ibinye aka na nkwekọrịta udo na ntuliaka

    Hope Uzodimma na Athan Achonu

    Ebe foto si, Hope Uzodimma/Athan Achonu Facebook

    Aka na-achị Imo steeti mabụru onye na-efere otu PC ọkọlọtọ na Ntuliaka ga-eme ụbọchị Satode, bụ Hope Uzodimma na ogbo ya nke Labour Party bụ Athan Achonu abịaghị ọgbakọ nkwekọrịta udo a kpọrọ na steeti ahụ taa bụ Wenezde.

    Ndị ọzọ abịaghị ọgbakọ ahụ nke otu 'National Peace Committee' hiwere gụnyereonye na-efere otu 'All Progressives Grand Alliance(APGA) bụ, Tony Ejiogu, na ogbo ya nke otu 'New Nigeria Peoples Party(NNPP), bụ Ben Odunze.

    Onye na-efere otu 'Peoples Democratic Party'(PDP) ọkọlọtọ bụ Samuel Anyanwu bịara ọgbakọ ahụ, laa, ikekwe n'ihi na ọ hụghị ndị ogbo ya si pati ndị nwere agba na steeti ahụ.

    Uzodimma, Achonu na Anyanwu zigara ndị osote ha, ha na ha so azọ ọkwa gọvanọ mana e nyeghị ha ohere ibinye aka n'akwụkwọ n'aha ndị zitere ha.

  2. Anyị dị njikere maka ntuliaka Imo steeti - Ndị uweojii

    Ndịuweojii dị njikere maka ọrụ

    Ebe foto si, Lagos state Police

    Onyeisi ndi uweojii bụ Kayode Egbetokun ekwuola na ha bụ ndị uweojii adịla njikere maka ntuliaka Imo steeti.

    Nke a na-abịa dịka o zigara Kọmịshona ndị uweojii ruru 15, ndị enyemaka kọmịshọna ruru 40 nakwa ndị osote kọmishọna ruru 29 na nkwado ntuliaka steeti ahụ.

    Henry Okoye bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru na nke a bụ iji gosi na ndị uweojii kere nkwụcha maka ihe na-eme eme.

    Okoye kwuru na ọ bụ osote onyeisi ndị uweojii ga-elebanye anya na ntuliaka nke onye enyemaka onyeisi ndị uweojii ga-enye nkwado n'ọrụ ahụ.

    O kwukwara na e wegaala Kọmịshọna nọbu na steeti ahụ bu Mohammed Barde n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja.

    "Anyị na-eme nke a iji kwado aka nkwụmọtọ nakwa ọchịchị onyekwuo uche ya n'atụmatụ ntuliaka a" ka Okoye kwuru.

    Ihe ọzọ o kwuru bụ "ọrụ anyị na ntuliaka a bụ idebe udo, anyị agaghị ekwe ka onye ọbụla jiri ọgbaghara mebie ihe ka o si aga, anyị dị njikere".

  3. NLC na TUC ga-akwụsị ọrụ ha niile n'Imo steeti ozugbo ozugbo

    Joe Ajero na ndị ọzọ anwụchiri

    Ebe foto si, Supplied

    Ndị otu NLC na TUC bụ otu abụọ niile jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa ekwola na ha ga-akwụsi ọrụ n'ebe niile n'Imo steeti bido n'etiti abalị taa.

    Emma Ugboaja bụ onye odeeakwụkwọ kachasị n'otu ahụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na nke a bụ iji gosi iwe ha maka ahụhụ nke onyeisi ha bụ Joe Ajero gabigara n'izu gara aga.

    Ugboaja kwuru na ọ bụ ihe mwute na gọọmentị etiti ajubeghi ha ase rue ugbua maka ihe mere.

    "Ndị mba ọzọ akọọla anyị jụọ ase mana ihe dị onyeisiala mma bụ inye ya (Hope Uzodimma) ọkọlọtọ

    "Anyị chọrọ ka e nwee nyocha juru afọ banyere ọnọdụ ndị otu anyị bụ ndị ọrụ n'Imo steeti

    Anyị chọrọ nyocha zuru oke si mba ofesi n'ahụike onyeisi anyị bụ Joe Ajero" bụkwa ihe ọzọ ọ na-ekwu

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na ha chọrọ ka akwuzuo ndị ọrụ Imo steeti niile ego ruru ha aka kama ịkpọ ha ndị ọrụ mmụọ ebe ha ka dị ndụ.

    Ndị isi otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ NLC na TUC amanyela abụbụ ọrụ zuru ala Naịjirịa niile bido n'ụbọchị 14 nke ọnwa Novemba.

    Otu abụọ a ruru mkpebi a dịka ha mechara nzụkọ pụrụiche n'ụbọchị Tusde n'Abuja.

    Ha kwuru na ndị otu ha niile adịla nkwadobe maka ya bụ abụbụ ọrụ ozugbo ozugbo.

    Ha mere nke a n'ihi mmegbu nke onyeisi ha bụ Joe Ajero gabigara n'izu gara aga n'Imo steeti.

    Ha gbarụrụ ihu maka mmegbu ahụ ma bo Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Mohammed Barde ebubo iso kpa nkata nwụchi na mmegbu Ajero nke mere n'Owere.

    Cheta na otu ahụ nyere gọọmentị abalị ise ịwepu ma gbanwee Kọmịshọna ndị uweojii ahụ dịka ha na-atụ Gọvanọ Hope Uzodimma aka na o so na nwụchi ahụ nke Uzodimma gọkwara n'onwe ya.

    Ha dọkwara aka na ntị na ha ga-amanye abụbụọrụ n'ala Naịjirịa niile maọbụrụ na anwụchighi ma kpụpụ ụfọdụ ndị ọrụ gọvanọ ha sị na aka ha dị na nwụchi ahụ ụlọikpe.

    Onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun ebugaala Barde n'ọkwa ọzọ ka ihe si kwụrụ ugbua.

  4. Ọgbaaghara adapụtala n'ọgbakọ Inec na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti", Ọgbaghara adaala dịka onyeisi Inec bụ mahmood Yakubu gwara ndị ntaakụkọ gbanyụọ igwe onyonyo ha.

    Aha onyonyo, Imo Election 2023: Nnukwu ọgbaghara adaala n'etiti Inec, PDP na APC n'Imo Steeti

    Onye ntaakụkọ BBC nọ n'ọgbakọ ahụ kọwara na onyeisi otu Independent National Electoral Commission bụ Mahmood Yakubu kwesiri ịnọ n'ọgbakọ ahụ mana ọ bịaghị kama o zitere onye nnọchiteanya bụ Kenneth Ukagu bụ kọmịshọna ndị Inec na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

    Dịka Yakubu bụ onye Ukagu na-anọchite kwuchara okwu, o nyere iwu ka ndị ntaakụkọ gbanyụọ igwe onyonyo ha ma kwụsị ise ihe na-eme.

    Mana ndị pati dị icheiche nọ ebe ahụ anabatachaghị atụmatụ a, nke mere na onye na-azọ ọkwa osote gọvanọ na pati People's Democratic Party PDP bụ Jones Onyeriri jụrụ ihe kpatara ụdịrị iwu a ma jụọ ka ọ bụ ihe nzuzo ka a na-eme.

    Onye na-azọkwa ọkwa osote gọvanọ na pati Labour nabatara okwu Onyriri, ndị ọzọ nọkwa na pati dị icheiche sokwara jụọ otu ajụjụ ahụ.

    Ebe e mere ọgbakọ

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ọgbakọ nke ngalaba na-ahzi ntuliaka bụ Inec biri n'ike n'Owere, isiobodo Imo state n'etiti Inec, APC na ndị pati ndị ọzọ.

    Onye ntaakụkọ anyị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ dịka onye nọchitere onyeisi Inec bụ Uchenna Sylva kwuru ka a gbanyụọ igwe onyonyọ (camera) na-edekọ ihe a na-eme ka ya bụ ọgbaghara dapụtara dịka Osote onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha otu Labour Party' bụ Tony Nwulu jụrụ, sị na e kwesịghị ikpuchi ihe ọbụla a na-eme ekwusi.

    Mgbagha ụka ahụ butere ịdụ aka na ọnụ na mkpọtụ dịka ndị pati PDP na LP kwuru na ha enweghị ntukwasiobi n'ebe onyeisi Inec Imo steeti bụ Sylvia Agu nọ.

    Ha kpọrọ oku ka Inec nke etiti wepụ ya n'ihi na ọ kwụbaghị aka ya ọtọ

    Ebe e mere ọgbakọ
  5. Ọgbaaghara adapụtala n'ọgbakọ Inec na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti

    Ọgbakọ' stakeholders' meeting Inec kpọrọ n'Owere

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ọgbakọ nke ngalaba na-ahzi ntuliaka bụ Inec biri n'ike n'Owere, isiobodo Imo state n'etiti Inec, APC na ndị pati ndị ọzọ.

    Onye ntaakụkọ anyị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ dịka onye nọchitere onyeisi Inec bụ Uchenna Sylva kwuru ka a gbanyụọ igwe onyonyọ (camera) na-edekọ ihe a na-eme ka ya bụ ọgbaghara dapụtara dịka Osote onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha otu Labour Party' bụ Tony Nwulu jụrụ, sị na e kwesịghị ikpuchi ihe ọbụla a na-eme ekwusi.

    Mgbagha ụka ahụ butere ịdụ aka na ọnụ na mkpọtụ dịka ndị pati PDP na LP kwuru na ha enweghị ntukwasiobi n'ebe onyeisi Inec Imo steeti bụ Sylvia Agu nọ.

    Ha kpọrọ oku ka Inec nke etiti wepụ ya n'ihi na ọ kwụbaghị aka ya ọtọ

  6. Liberia election: George Weah na onye na-ama ya aka na-agba nhatanha dịka a na-agụkọ vootu

  7. Liberia Election: George Weah chọrọ ohere ọzọ n'agbanyeghị nsogbu juru Liberia

  8. Brice Oligui Nguema: Onye bụ nwoke ike a chụpụrụ Ali Bongo n'ọchịchị na Gabon?

  9. Ihe onyonyo ndị na-egosi ego n'ime akpatị e si mba Gabon?

  10. Ali Bongo: Tinubu, African Union, akatọọla etu ndị agha si chụtuo onyeisiala Gabon

  11. Gabon election: Onyeisiala Ali Bongo chọrọ ịchị ugboro atọ

  12. Mba CAR ga-eme ntuliaka 'referendum' maka onyeisiala ha ịzọ ọkwa nke ugboro atọ

  13. Abdourahamane Tchiani: Ọchịagha a ekwupụtala onwe ya dịka onyeisiala Niger Republic

  14. Travis King: Kpọlataranụ m nwa m- Nne onyeagha America gbabara North Korea

  15. France riots: Nchịkọta ihe merela kamgbe ndị uweojii gbagbuchara otu nwokoroọbịa

  16. Maada Bio emeriela ntuliaka onyeisiala mba Sierra Leone nke ugboro abụọ

  17. Rishi Sunak agbasaala ozi mbụ ya dịka Praịm Minista Briten

  18. Xi Jinping ewerela oche ọchịchị mba China nke ugboro atọ

  19. Liz Truss, Praịm Mịnịsta mba Briten agbaala arụkwaghị m

  20. Xi Jinping: Ihe ị kwesịrị ịma maka onyeisiala mba China