Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. Rwanda Genocide: Alọghịchịrị m n'ụlọ kamgbe afọ 30 m gbara ọsọndụ n'ihi ogbugbu agbụrụ

  2. N'ihi nnyocha mpụ: Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Onyeisioche ụlọomeiwu Saụt Afrịka bụ Nosiviwe Mapisa-Nqakula agbaala arụkwaghịm dịka ndị uweojii wụchara n’ụlọ ya n’oge a na-enyocha ya maka ebubo mpụ.

    Mapisa-Nqakula bụ onye a na-ebo ebubo ịnara ngarị maka ịnyepụ ọrụngo n’oge ọ bụụrụ minister nchekwa.

    Ọ gọọla aka na ụkwụ ya n’ebubo ahụ ma kwuo na ihe mere o ji gbaa arụkwaghịm “enweghị ụzọ ọbụla o siri bụrụ ịnabata na aka ya adịghị ọcha.”

    O kwuru na dabere etu nnyocha ahụ siri dị oke mkpa na ya agaghị agakwa n’ihu n’ọrụ ya dịka onyeisioche ụlọomeiwu.

    Nwaanyị ahụ gbara afọ 67, onye sooro buo agha megide ịkpa oke bụụrụ onyeisioche ụlọomeiwu n’afọ 2021 mana tupu mgbe ahụ, ọ bụụrụ minista nchekwa ruo afọ asaa.

    N’izuụka gara aga, ndị ọkaikpe Mapisa-Nqakula gbara akwụkwọ arịrịọ iji chọọ ka ụlọikpe nye iwu ga-akwụsị ndị ọrụ nchekwa ịnwụchi ya dịka ha kwuru na nke ahụ ga-emechu ya ihu.

    N’ụbọchị Tuzde 2 Eprel 2024, ndị ọkaikpe jụrụ ịnabata arịrịọ ahụ dịka ha sịrị na okwu ahụ abụghị nke bịara na mberede ebe ha na-apụghị atụ anya nnwuchi nke na-emebeghị eme.

    Ozi sitere n’akwụkwọ akụkọ Business Day na-ekwu na a na-ebo Mapisa-Nqakula ebubo ịnapụ otu onye nwere ụlọọrụ ego ruru $120,000 (£96,000) iji nye ya ikike ibuga ngwa ndịagha mba Saụt Afrịka.

  3. E duola Bassirou Diomaye Faye n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba Senegal

  4. 'Students loan': Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ

    Onyeisiala Bola Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ
    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ

    Onyeisiala Bola Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ.

    Onyeisiala mere nke a n’obi ọchịchị Naịjirịa dị n’Abuja n’ụbọchị Wenezde 3 Eprel 2024.

    Atụmatụ iwu ahụ akpọkwasara ‘mkpebi maka ịgbanwe iwu ga-arọpụtara ụmụakwụkwọ ego mgbazinye nke afọ 2024' bụ nke ekepụtara iji hiwe akpaego a ga-eji kwadoo ụmụakwụkwọ ndị nọ n’ụlọakwụkwọ dị elu.

    N’ime ọnwa Nọvemba 2023, ụlọomeiwu Naịjirịa kwadọrọ atụmatụ iwu ahụ bụ nke chọrọ ka ehiwe ụkpụrụ a ga-eji na-agbazinye ụmụakwụkwọ Naịjirịa ego.

    Dịka onyeisi ndị ọrụ n’obi ọchịchị Naịjirịa bụ Femi Gbajabiamila siri kwuo, iwu ọhụrụ a bụ ụdị ya nke mbụ na Naịjirịa dịkwa ka ọ ga-enye aka ịhụ na enweghị nwaafọ Naịjirịa ọ bụla agọnarịrị ohere agụmaakwụkwọ.

  5. Ahọpụtala Sonko dịka Prime Minister Senegal

    Praịm Minista Senegal ọhụrụ bụ Ousmane Sonko

    Ebe foto si, Ousmane Sonko/Facebook

    Nkọwa foto, Praịm Minista Senegal ọhụrụ bụ Ousmane Sonko

    Onyeisiala Senegal ọhụrụ bụ Bassirou Diomaye Faye ahọpụtala onye ndu pati kachasị ukwuu na-agba gọọmenti mba ahụ ụkwụ bụ Ousmane Sonko dịka Praịm Minista.

    Ousmane Sonko bụ onye zụlitere Faye n’igwu ndọrọndọrọ ọchịchị dịkwa ka a tụrụ ha bụ mmadụ abụọ mkpọrọ tupu ahazie ntụliakaelu n’ọnwa Maachị.

    Onyeisiala pụrụ apụ bụ Macky Sall nyere ha mgbaghara tinyere ọtụtụ ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ maka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Obi ọchịchị Senegal zipụrụ ozi n’ọbaozi X kwuo sị “n’ime awa ole na ole educhara Faye n’iyi ọrụ, ọ họpụtala Sonko dịka Praịm Minista.”

    Sonko bụ onye a kpọrọ aha na mbụ dịka onye ga-eji aha pati na-agba gọọmenti ụkwụ zọọ ọkwa onyeisiala tupu anwụchie ya ma kwupụta ya dịka onye na-etozughị oke isoro zọọ ya bụ ọkwa.

    N’okwu ya dịka educhara ya n’iyi ọrụ n’ụbọchị Tuzde 2 Eprel 2024, Faye kwuru na Senegal ga-abụ mba olileanya nke ọchịchị ọhakarasị ya ga-agbasikwu ike.

  6. Senegal First Ladies: Lee ndị nọrọla dịka isinwaanyị mba Senegal kemgbe afọ1960

  7. Ngagharịiwe megide Benjamin Netanyahu akpọtụọla na Israel

  8. Labour Party: Julius Abure abaghachila n'ọkwa

    Ahọpụtagharịala Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party

    Ebe foto si, Labour Party/Facebook

    Nkọwa foto, Ahọpụtagharịala Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party

    Ahọpụtagharịala Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party.

    Ndị nnọchiteanya niile bịara nnukwu ọgbakọ Labour Party haziri jiri otu olu kwuo na ọ bụ Abure ka ha chọrọ.

    Ọ bụ n’ụbọchị Wenezde 27 Maachị 2024 ka Abure tuuru ugo mmeri na nnukwu ọgbakọ ntuliakaelu Labour Party haziri na Nnewi nke Anambra Steeti.

    Onyeisioche nnukwu ọgbakọ ahụ ma bụrụkwa osote aka na-achị Abịa Steeti bụ Ikechukwu Emetu kwupụtara Abure dịka onye nwetara mmeri.

    Cheta na Julius Abure na ndị isi otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ NLC nọ kemgbe izuụka ole na ole na-enwe nghọtahie dịka ha kpọrọ oku ka ọ gbatuo n’ọkwa.

  9. Etu mba Senegal si wee nabata Bassirou Diomaya Faye ka o meriri ntuliaka

  10. Kabaaka onye otu egwu Oriental Brothers anwụọla

  11. Abia Pension law: Alex Otti ọ napụrụ Ikpeazu, T.A Orji na Uzor Kalu ara n'ọnụ?

  12. Alex Otti akwụsịla ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension' n'Abịa Steeti

    Gọvanọ Alex Otti abịanyela aka n'iwu iji kwụsị ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension'
    Nkọwa foto, Gọvanọ Alex Otti abịanyela aka n'iwu iji kwụsị ndị gọvanọ pụrụ apụ ịnara 'pension'

    Aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti abịanyela aka n’iwu iji machie ịkwụ ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ bụ pension.

    Ọ bụ n’ụbọchị Tọzde 21 Maachị 2024 ka Gọvanọ Otti bịanyere aka n’iwu ahụ bụ nke a maara ugbua dịka ‘Abia State Governors and Deputy Governors Pensions (Repeal) Law 2024’.

    N’oge ọ na-abịanye aka n’iwu ahụ, Gọvanọ Otti kwuru na gọọmenti abụghị maka mmasị nke onwe n’ihi na mmasị nke onwe na-ebibi gọọmenti.

    Dịka o siri kwuo “tupu iwu ọhụrụ a apụta, ọtụtụ mmadụ ndị na-eso ihe anyị na-eme ghọtara na anyị agaghị agakwa n’ihu na-akwụ ndị ọchịchị pụrụ apụ ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ na ego mmachi akpa ndị ọzọ.”

    Cheta na ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 19 Maachị 2024 ka ụlọomeiwu Abịa Steeti nọọrọ bufee atụmatụ iwu nke kachapụrụ iwu nke dị adị na Steeti ahụ bụ nke nyere ndị gọvanọ Steeti ahụ pụrụ apụ na ndị osote ha ikikere ịnara ụgwọ ndị lara ezumiike nka ọrụ.

  13. Etu ụmụaka atọ si mie ala n'Imo Steeti ma bụrụ ndị a na-achọ achọ kamgbe otu izuụka

  14. Ọ naghị ewute m na m kagburu ntuliaka mba Senegal - Macky Sall

  15. Lee otu agha nnupuisi dị iche iche na-achọ iwere ọchịchị na mba Haiti

  16. Gọọmenti Enugwu ewerela katapila kwọgbuo ọkụkọ karịrị 30,000 na Nchatancha Nike

  17. Igbo Culture: Gịnị bụ Ikoro na uru ọ bara n’omenala Igbo?

  18. Onitsha building collaspe: "Amaghị m na ụlọ anyị nọ n'ime ya na-ada ada ruo mgbe m hụrụ onwe m n'ime ụvụrụ aja"

  19. Ọ bụghị ndị Hausa maọbụ Fulani wakporo ụmụakwụkwọ FUTO - Ndị uweojii

  20. Rotimi Akeredolu: Etu ụka olili ya na njem ikpeazụ ya si aga