Off Cycle elections 2023: Diri ekelela ndị Bayelsa maka mmeri ya

Ntuliaka ọkwa Gọvanọ na Kogi, Bayelsa na Imo steeti ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chimezie UcheAgbo, Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu, Chukwunaeme Obiejesi and Jessica Nwankwo

  1. ICPC anwụchiela mmadụ isii zụrụ vootu ndị mmadụ n'Imo steeti

    Ndị ọrụ ICPC

    Ebe foto si, ICPC/X

    Ndị ọrụ Independent Corrupt Practices Commission bụ ICPC n'ịchafụ ekwuola na ha anwụchiela mmadụ isii zụrụ vootu mmadụ na ntuliaka e mere n'Imo steeti.

    Ngalaba ahụ depụtara n'akara X (bụbu Twitter) ha na ndị ọrụ ha nwụchiri ndị mmadụ n'ọgbọ ntuliaka asaa ma jichie nde naira anọ.

    Ha sị na otu onye n'ime ndị ha nwụchiri ji akwụkwọ ebe e dere aha nakwa akara ekwentị ndị na-atụ vootu.

    "Ndị niile anyị nwụchiri nọ n'aka anyị ugbua, anyị edetuola aha ha na okwu akaebe ha" ka ha dere.

    Ha sị kwa na ha atọhapụla ndị ahụ nwamgbenta dịka nyocha ka na-aga n'ihu.

  2. Ndị Imo, ụnụ emela- Uzodimma

    Hope Uzodimma

    Ebe foto si, Hope Uzodimma

    Aka na achị Imo steeti bụ Hope Ụzodimma ekelela ndị Imo maka ịkwado ya na ntuliaka ọkwa Gọvanọ steeti ahụ e mere ụbọchị Satode.

    Uzodimma nke APC ji vootu dị 540, 308 merie Sam Anyanwu nke PDP bụ onye nwetara vootu dị 71, 503, ebe Athan Achonu nke otu 'Labour Party' nwetara vootu 64, 081.

    N'ozi ya ụbọchịụka dịka a kpọpụtachara aha ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ nke nyere ya ohere agba nke abụọ, Uzodimma sịrị, " Nkwado pụrụ iche ụnụ nyere m na ntuliak ụnyahụ tụrụ m n'anya."

    "Ntụwasa obi ụnụ nwere n'm ịga n'ihu na edu steeti anyị bụ ihe mkpalite mmụọ.".

    Ọ gara n'ihu kwee nkwa imezu nkwa nile o kwere oge ọ na-achụ nta vootu ma rịọ ndị ya na ya zọkọrọ na ntuliaka ahụ ka ha sonyere ya n'ịkwalite steeti ahụ.

  3. Na Akpọtụ Ugbu A, Anyị ga-agbagha mmeri Uzodimma n'ụlọikpe - Ndị LP nke Imo steeti

    hOPE uZODIMMA NA ATHAN ACHONU

    Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook/BBC

    Otu Labour Party n'Imo steeti eforola ntutu taa na ha ga-agbagha mmeri Hope Uzodimma nke APC n'ụlọikpe.

    Onyeisioche otu ahụ n'Imo steeti bụ Callistus Iheagwa kwuru nke a mgbe ọ na-ezi ndị ntaakụkọ ozi dịka akpọpụtachara Hope Uzodimma dịka onye meriri ya bụ ntuliaka ọkwa Gọvanọ.

    Iheagwa kwuru na atụmatụ ntuliaka ahụ juputere na mpụ na nrụrụaka.

    O boro ndị ọrụ nchekwa ebubo na ha nyere ndị ọrụ Inec aka ihu na e mere wayo na ntuliaka ahụ iji mee ka Uzodimma merie.

    Ha sị na mpụtara ntuliaka ahụ nke ezigbo ya gosiri na ọ bụ onye nke ha bụ Athan Achonu meriri ntuliaka ahụ.

    Dịka ọ na gwa ndị ntaakụkọ okwu, Iheagwa sị na ntuliaka ahụ bụ "ohi e zuru n'ehihie nakwa mmetọ ọchịchị onyekwuoucheya"

    Ọ sị na ntuliaka emeghi n'ụfọdụ obodo gụnyere Orsu, Orlu, Ideato North, Okigwe, Oguta nakwa Owerri Munincipal mana Inec gara n'ihu deere ha mpụtara ntuliaka

    Ọ tara onye ọrụ Inec bụ Abayomi Fasina maka egeghị ntị n'okwu ndị a tupu ọ gaa ihu gụkọọ vootu ndị o ji ma kpọpụta Uzodimma dịka onye mmeri.

    Ihejiagwa sị "ihe mere n'Imo steeti bụ adigboroja. Ọ bụ ihe ihere etu ndị ọrụ nchekwa si nye ndị ọrụ Inec na ndị otu APC ohere na nchekwa ịrụrụaka na ntuliaka ahụ".

    Hope Uzodimma onwe ya na-akpọ oku ka ndị o meriri bịa ka ha jikọọ aka bulie Imo steeti.

  4. Lee ka mkpọpụta mpụtara ntuliaka Bayelsa steeti si aga

  5. Atọrọla ụfọdụ ndị ọrụ Inec na Brass dị na Bayelsa steeti

    onyeisi ngaslaba INEC

    Ebe foto si, INEC/Facebook

    Ngalaba INEC na-elekọta ntuliaka na Naijirịa etiela mkpu na atọrọla ụfọdụ ndị ọrụ ha gara ọrụ n'okpuruọchichị Brass dị na Bayelsa.

    Nke a na-abịa dịka a na-edekọ na agụkọ vootu ntuliaka ọkwa Gọvanọ emere na steeti ahụ.

    N'ozi ha depụtara n'akara Twitter ha, ha kpọrọ ndị ọrụ nchekwa oku ha gbaa mbọ hụ na azọpụtara ndị ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  6. Uzodimma emeriela na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Imo steeti

    Hope Uzodimma

    Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

    Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma emeriela n'okpuru ọchịchị 27 dị n'Imo steeti, dịka Inec si kpọpụta.

    Uzodimma, ji vootu dị 540, 308 merie Sam Anyanwụ nke PDP bụ onye nwetara vootu dị 71, 503. ebe Athan Achonu nke ou 'Labour Party' nwetara vootu 64, 081.

    O nweghị pati n'ime 17 so APC zọọ ọkwa gọvanọ na ntuliaka e mere n'abaị 11 nke ọnwa Novemba afọ 2023 meriri n' okpuru ọchịchị ọbụla na steeti ahụ.

  7. Imo State Governorship Election: Ndị Imo ekwuola na Uzodimma, a ga ya ugboro abụọ

  8. Etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo Steeti si kwụrụ

    Ideato North

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 86905

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 9609

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 9161

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 389

    Vootu niile a tụrụ: 9550

    APC: 5271

    LP: 1522

    PDP: 2062

    Ihitte Uboma

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 52108

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 17537

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 17358

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 179

    Vootu niile a tụrụ: 17537

    APC: 11099

    LP: 2766

    PDP: 3077

    Mbaitoli

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 153283

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 24186

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 23014

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 972

    Vootu niile a tụrụ: 23986

    APC: 12556

    LP: 4007

    PDP: 5343

    Ngor-Okpala

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 102048

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 22111

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 21492

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 511

    Vootu niile a tụrụ: 22003

    APC: 14143

    LP: 2716

    PDP: 3451

  9. E tiri onye nnọchiteanya Labour pati ihe na ngụkọ vootu Imo steeti

    Aha onyonyo, Etu e siri kụọ onye nnọchite Labour pati ihe n'Imo

    Ndị 'agent' pati dị icheiche kụrụ onye nnọchiteanya pati Labour ihe na ngụkọ vootu Imo steeti maka na o kwuru na o nweghi ntuliaka e mere n'Ọsụ na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ ụbọchị Satọde.Ihe a bụ nnukwute ihe ịtụ n'anya.

  10. Etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo si kwụrụ

    Ikeduru

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu:119987

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 33662

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 32183

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 529

    Vootu niile a tụrụ: 32712

    APC: 22356

    LP: 1377

    PDP: 7258

    Ehime Mbano

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 79212

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 13027

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 12484

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 298

    Vootu niile a tụrụ: 12782

    APC: 6632

    LP: 4958

    PDP: 861

    Orlu

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 103223

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 49229

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 48027

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 359

    Vootu niile a tụrụ: 48386

    APC: 37614

    LP: 2424

    PDP: 3690

    Ohaji/Egbema

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 107456

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 21366

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 20755

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 494

    Vootu niile a tụrụ: 21249

    APC: 5271

    LP: 1522

    PDP: 2062

  11. Uzodimma enwetala vootu kachasị n 'okpuru ọchíchị 20 n'ime 27 dị n'Imo steeti

    Hope Uzodimma

    Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

    Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma bụ onye vootu ya kachasí ugbua n'ime Okpuru ọchịchị iri abụọ n'ime 27nke ụlọọrụ Inec kpọpụtarala mpụtara ha.

    Uzodimma bụ onye feere otu APC ọkọlọtọ nwetara vootu 429, 518 n'Okpuru Ọchịchị 20 dịka si kwuo.

    Ọkpuru ọchịchị Uzodimma meriela gụnyere Oru West, Owerri North, Obowo, Nwangele, Orsu, Owerri Municipal, Okigwe, Ideato South , Onuimo, Ngor Okpala, Oru East, Isu, Nkwere, Ahiazu Mbaise, Owerri West, Isiala Mbano, Ezinihitte Mbaise, Oguta, Aboh Mbaise na Njaba.

    A na-ele mpụtara si okpuru ọchịhcị asaa fọrọ afọ.

    Onyye nchịkọta ntuliaka Imo steeti (returning Officer) ma bụrụkwa onyeisi Mahadum 'University of Oye', Ado Ekiti in Ekiti bụ onye kpọpụtara mpụtara ndị ahụ kuwru ka e gaa ezu,ike ọkara awa ma laghachị.

  12. Etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti si kwụrụ

    Ikeduru

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu:119987

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 33662

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 32183

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 529

    Vootu niile a tụrụ: 32712

    APC: 22356

    LP: 1377

    PDP: 7258

    Ehime Mbano

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 79212

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 13027

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 12484

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 298

    Vootu niile a tụrụ: 12782

    APC: 6632

    LP: 4958

    PDP: 861

    Orlu

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 103223

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 49229

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 48027

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 359

    Vootu niile a tụrụ: 48386

    APC: 37614

    LP: 2424

    PDP: 3690

    Ohaji/Egbema

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 107456

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 21366

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 20755

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 494

    Vootu niile a tụrụ: 21249

    APC: 5271

    LP: 1522

    PDP: 2062

  13. Etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo Steeti si kwụrụ

    Aboh Mbaise

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 111207

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 16084

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 15415

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 375

    Vootu niile a tụrụ: 15790

    APC: 9638

    LP: 2455

    PDP: 1724

    Owerri West

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 140242

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 16296

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 15712

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 511

    Vootu niile a tụrụ: 16223

    APC: 9205

    LP: 2597

    PDP: 3305

    Isiala Mbano

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 99076

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 15911

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 15202

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 329

    Vootu niile a tụrụ: 15531

    APC: 10860

    LP: 2419

    PDP: 1659

    Ezinihite Mbaise

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 91272

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 16971

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 16282

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 458

    Vootu niile a tụrụ: 16740

    APC: 8473

    LP: 3332

    PDP: 2737

    Oguta

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 95152

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 64260

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 63676

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 271

    Vootu niile a tụrụ: 63974

    APC: 57310

    LP: 1941

    PDP: 2653

  14. Etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo Steeti si kwụrụ

    Oru East

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 85080

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 74324

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 74286

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 4

    Vootu niile a tụrụ: 74290

    APC: 67315

    LP: 3443

    PDP: 2202

    Isu

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 55203

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 15974

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 15974

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 156

    Vootu niile a tụrụ: 15932

    APC: 11312

    LP: 1253

    PDP: 2508

    Ahiazu Mbaise

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 98887

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 16097

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 15353

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 525

    Vootu niile a tụrụ: 15878

    APC: 8369

    LP: 2214

    PDP: 3507

    Nkwerre

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 59926

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 26993

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 26764

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 142

    Vootu niile a tụrụ: 26906

    APC: 22488

    LP: 1320

    PDP: 2632

  15. Etu mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti si kwụrụ ugbua

    Orsu

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 56996

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 19939

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 19589

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 206

    Vootu niile a tụrụ: 19795

    APC: 18003

    LP: 813

    PDP: 624

    Okigwe

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 75410

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 63935

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 62970

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 965

    Vootu niile a tụrụ: 63935

    APC: 55585

    LP: 2655

    PDP: 1688

    Ideato South

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 79361

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 21935

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 21370

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 280

    Vootu niile a tụrụ: 21650

    APC: 16891

    LP: 1649

    PDP: 2469

    Onuimo

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 36717

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 18405

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 18240

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 36

    Vootu niile a tụrụ: 18276

    APC: 13434

    LP: 1753

    PDP: 2676

  16. E bidola ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvano n'Imo Steeti

    Mkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Inec amalitela ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti.

    Ha malitere mkpọpụta a mgbe ọ kụrụ elekere 2:40am nke isi ụtụtụ ụbọchị Sọnde.

    Onye nọ n'isi mkpọpụta mpụtara ntuliaka a bụ Ọkammụta Abayomi Fasina bụ onyeisi mahadum etiti Oye-Ekiti.

    Lee ka mpụtara a si kwụrụ ugbua;

    Oru West

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 42965

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 41373

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 581

    Vootu niile a tụrụ: 42318

    APC: 38026

    LP: 1867

    PDP: 987

    Njaba

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 64068

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 12098

    APC: 8110

    LP: 995

    PDP: 2404

    Owerri North

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 134555

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 18398

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 17440

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 576

    Vootu niile a tụrụ: 18016

    APC: 8536

    LP: 4386

    PDP: 3449

    Obowo

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 68690

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 22214

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 21907

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 264

    Vootu niile a tụrụ: 22171

    APC: 17514

    LP: 3404

    PDP: 711

    Nwangele

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu: 55535

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu: 33259

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 32597

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 362

    Vootu niile a tụrụ: 32959

    APC: 29282

    LP: 895

    PDP: 2132

    Owerri Municipal

    Ndị debanyere aha ịtụ vootu:134169

    Ndị e nyere ikike ịtụ vootu:11110

    Vootu ndị a tụrụ dị mma: 10813

    Vootu ndị a jụrụ ajụ: 241

    Vootu niile a tụrụ: 11054

    APC: 5324

    LP: 2914

    PDP: 2180

  17. A haziela ebe ndị a ga-anọ kpọpụta mpụtara ntuliaka n'Imo, Kogi na Bayelsa Steeti

    Ebe a ga-anọ kpọpụta mpụtara ntuliaka

    Akwadochaala ebe a ga-anọ gụkọọ mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Imo, Kogi na Bayelsa Steeti.

    A mabeghi kpọmkwem mgbe a ga-ebido ịkpọpụta ya n’Imo steeti dịka a ka na-agụkọ vootu na wọọdụ dị iche iche tupu e buru ha gawa okpuruọchịchị steeti.

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka ekwuola na ọ bụ n’abalị a ma ọ kụọ elekere itoolu ka a ga-amalite ịkpọpụta nke Bayelsa Steeti.

    N’otu aka ahụ, a na-atụ anya na nke Kogi Steeti ga-amalite n’abalị a mana ngụkọ ka na-aga n’ihu na wọọdụ na wọọdụ.

    Ebe ngụpụta mpụtara ntuliaka na Bayelsa Steeti
  18. Etu e si gụkọọ vootu n'ụfọdụ ebe na Kogi Steeti

    Aha onyonyo, Etu e si gụkọọ vootu n'ụfọdụ ebe na Kogi Steeti
  19. Etu e si gụkọọ votu n'ebe ụfọdụ n'Imo Steeti

    Aha onyonyo, Etu e si gụkọọ vootu n'ụfọdụ ebe n'Imo Steeti
  20. Etu EFCC si nwụchie ntị na-azụ vootu n’Imo, Kogi na Bayelsa Steeti

    Ndị na-azụ vootu a nwụchiri n'Imo, Kogi na Bayelsa Steeti

    Ebe foto si, EFCC/Facebook

    Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC ekwuola na ha nwuchiri ndị na-azụ vootu iri na anọ n’Imo, Bayelsa nakwa Kogi Steeti bụ ebe e mere ntuliaka ọkwa gọvanọ taa.

    Ụfọdụ ebe ha sị na ha nwụchiri ndị a gụnyere Otueke, Adawari Playground dị na Bayelsa Steeti, nakwa ọtụtụ ọgbọ ịtụ vootu dị n’Imo nakwa Kogi steeti.

    Ha sị na e mere nke a site na nnyocha ha malitere ime kamgbe banyere ntuliaka ọkwa gọvanọ a.

    Ha kwuru na ngụkọ ego niile a natara n’aka ndị a dị nde naịra iri na otu na puku iri anọ.

    N’otu aka ahụ ha jichikwara ụgbọala abụọ ndị a ji akpa arụ a.

    EFCC kwuru na a ga-akpọpụ ndị a n’ụlọikpe na-egbughi oge ma e mechaa nyocha.

    Ego e ji azụ vootu

    Ebe foto si, EFCC/Facebook