"Anọọla m n'ọrụ ịrụzi akụrụngwa latrik e ji ebi n'ụlọ kamgbe afọ iri anọ" - Woman Engineer

"Anọọla m n'ọrụ ịrụzi akụrụngwa latrik e ji ebi n'ụlọ kamgbe afọ iri anọ" - Woman Engineer
    • Onye dere ya, Kalu Ikechukwu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
  • Mgbe e biputara ya

Nwada Chinyere Onuoha bụ nwaanyị na-arụzi ụfọdụ akụrụngwa latrik e ji ebi n'ụlọ akọwaala etu o si malite ọrụ ahụ.

Na mkparịta ụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, o kwuru na ọ bụ kamgbe afọ 1985 mgbe ọ gụchara akwụkwọ Sekọndịrị ka di ya kuziiri ya ọrụ ahụ.

O kwuru na kamgbe ahụ rute ugbua na ọ ka nọ n'ọrụ ahụ - ihe karịrị afọ iri anọ (40years).

Nwada Chinyere sị na ụfọdụ ihe ndị ọ na-arụ gụnyere; ‘kettle’ a m ji n’aka, ‘blender, iron, electric stove, stabilizer, fan, boiler, microwave’ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji ebi n’ụlọ.

N'okwu ya, "Ndị mmadụ na-akpọ m ‘woman engineer’ maka na ana m arụzi akụrụngwa latrik dịka ‘kettle’ a m ji n’aka, ‘blender, iron, electric stove, stabilizer, fan, boiler, microwave’ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji ebi n’ụlọ.

"Ihe m na-anaghị arụzi bụ ‘TV, washing machine, radio maọbụ fan’.

"Ana m anọ n’okporoụzọ Christ Church dị nso n’ahịa Eke Onunwa na-arụ ọrụ m.

"Ọ bụ nna m ukwu, di m kuziiri m ọrụ a, ọ bụ n’aka ya ka o bidoro.

"Na mbụ, mgbe m pụtara n’ụlọakwụkwọ sekọndịrị, m chọbuuru ịbụ onye nkuzi mana mgbe m lechara ule ‘Waec’ n’afọ 1985 m bịara lụọ di, ihe a m na-arụ ugbua bụ ihe di m na-arụ, m soro ya n’ọrụ aka na-arụ ihe ndị a.

"Ihe a m na-akọrọ gị mere n’ebe afọ 1985 na 1986, ya mere kamgbe ahụ ọ bụ ihe a ka m na-arụ rute ugbua.

Ọ gara n'ihu kwuo na o jiri ọrụ ahụ rụọ ụlọ, zụọ nwa ya n'ụlọakwụkwọ ma nwete ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

"Ọrụ a enyerela m aka ebe ọ dị ukwuu, o nyerela m aka zụọ nwa m nọ ebe n’akwụkwọ ka ọ bụrụ ọkaiwu, o nyerela m aka m rụta ụlọ ebe m bi, nwee ike na-eri nri kwa ubọchị na-enyekwara ndị mmadụ aka etu m nwere ike."

Kirie ihe niile o kwuru n'onyonyo ahụ;