You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kedụ ka e si see Messi foto ebe ọ na-asa Yamal ahụ?
I kwenyere n'ọrụ ebube maọbụ n'akara aka nke bekee kpọrọ 'destiny?
Ị nụ akụkọ etu odogwu n'egwụbọọlụ n'ụwa bụ Lionel Messi nke mba Ajentịna na Lamine Yamal nke mba Spen si zute onwe ha afọ iri na itoolu gara aga, ị mara na ihe na-akwụ, ihe akwụdebe ya.
N'afọ 2007, Messi dị afọ 20 aghọọla ọkpọka n'egwu bọọlụ n'ụwa dịka ọ na-agbara otu egwu bọọlụ Barcelona nke mba Spen, ebe Yamal bụ nwa dị naanị ọnwa ise e ku n'aka.
Na Nzute ahụ nke oseefoto bụ Joan Monfort sere ha foto ahụ na-ewu n'ụwa ugbua, nne na nna Yamal, bụ ndị si mba Moroko na Ekwitorial Gini zutere Messi dịka ha ka kwagachara Catalonia dị na Spen ga biri.
Ezinaụlọ Yamal meriri n'asọmpi ndị ga-enwe ike zute Messi nke otu ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ nke Catalonia hiwere site na nkwado Unicef nakwa otu ụlọọrụ na-ebi akwa elu nke nyere ohere ka nwa ha na ọkaibe n'egwu bọolụ n'ụwa bụ Messi see foto gosiri ebe Messi na-asa Yamal ahụ.
Okwu na-ewu ebe niile na soshịal midịa bụ nzute Lionel Messi na Lamine Yamal n'asọmpi Iko Mbaụwa 2026.
Messi dị afọ iri ato na itoolu(39)na-agba asọmpi Iko Mbaụwa ikpeazụ ya tupu ọ laa ezumike,ebe Yamal dị afọ iri na itoolu (19)bụ onye na-esonye n'asọmpi Iko Mbaụwa nke mbụ ya.
Joan Monfort bụ onye sere foto ahụ oge ọ dị afọ iri atọ na itoolu (39) kwuru na nke a bụ 'mpịachi akụkọ' ahụ ma bụrụkwa ihe oke ọṅụ?
Gị onye na-eso anyị, i kwenyere n'o si n'akara aka"?