Iwu Naịjirịa ọ kwadoro ndị nkụzi ịpịa ụmụakwụkwọ ụtalị?

Iwu Naịjirịa ọ kwadoro ndị nkụzi ịpịa ụmụakwụkwọ ụtalị?
Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii Anambra Steeti sị na ha anwụchiela Dim Ebere bụ onye nkụzi a na-ebo ebubo na ọ pịara nwataakwụkwọ dị afọ 12 ụtalị, nke mere o jiri nwụọ, n'obodo Adazi-Anị dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga sịrị na nwaanyị ahụ dị afọ 47 jiri aka ya nyefee onwe ya n'ụlọọrụ ndị uweojii dị na Neni.

Akụkọ kwuru na nwatakịrị ahụ nwụrụ n'ụlọọgwụ ebe e bugara ya, n'ihi nnukwu mmerụahụ o nwetere oge onyenkụzi ya pịapụchara ya mkpụrụ ọkwụrụ n'anya n'ụlọakwụkwọ.

Ka ọ dị, ndị uweojii kwuru na ha ejichiela onyenkụzi ahụ a na-enyo enyo, dịka ha ga-enyefe ya n'aka ngalaba ha na-enyocha mpụ bụ State Criminal Investigation Department dị n'Awka maka ime ezigbo nnyocha.

Ugbua, dere duu ka m kọọrọ gị ihe iwu Naịjirịa kwuru gbasara inye ụmụakwụkwọ ntaramaahụhụ.

Ọ dị mkpa ka ị ghọta, na o nweghị iwu ọbụla kwadoro ịpịa ụmụakwụkwọ ụtalị na Naịjirịa, kama o nwere ụfọdụ iwu ndị na-echekwa ụmụakwụkwọ site na ntaramaahụhụ dị iche iche.

Mpaghara 34, nke Iwu Mmegharị Naịjirịa nke afọ 1999 kwupụtara na mmadụ niile nwere ugwu na nnwereonwe site n'omume ọbụla nwereike ibutere ha mmetọ.

N'aka nke ọzo, iwu na-echekwa oke ruuru ụmụaka bụ Child Rights Act kwuru ya hooha na nwatakịrị ọbụla nwere ugwu na nnweronwe site n'ụdị mmekpaahụ ọbụla. Iwu a mere ka ọ bụru arụ ịpịa nwataakwụkwọ ụtalị maọbụ nye ya ntaramaahụhụ ọbụla ga-ebutere ya ihe mgbu.

Mana ụfọdụ ndị ọkachamara tụrụ aro na ndị nkụzi Naịjirịa kwesịrị ịnabata usoro ndị ọzọ e si agbazi ụmụakwụkwọ olu n'ụdị na-agaghị ebutere ha mmerụahụ maọbụ ihe mgbu, dịka inye ha ndụmọdụ, iji umeala na ịhụnanya abara ha mba, nakwa ịkọọrọ ha akụkọ nwere ihe mmụta dị omimi.