Ịgba bọọlụ agaghị egbochi nwaanyị ịlụ di maọbu ịmụ nwa
Ann Chiejina bụ nwaanyị gbaala Naịjirịa bọọlụ ma na-ekuziri ụmụnwaanyị Nịjirịa.
Na mkparịta ụka ya na BBC kọ ọ zara ajụjụ dị icheiche ma nyekwa ndụmọdụ pụrụiche.
N'okwu ya "aha m bụ Ann Chiejine, m bụkwa nwa afọ Owerri, Imo steeti". Esi m n'obodo a na-akpọ Ụrụata.
Achọrọ m iji ohere a gwa nne na nna anyị okwu, na ụmụ anyị nwaanyị chọrọ ịgba bọọlụ kwesiri ịmara na bọọlụ agaghị egbochi ha ịlụ di maọbụ ịmụ nwa.
Dịka mụwa, agbara m bọọlụ, lụọ di, Chukwu mere m ebere m amụtakwa nwa. A mụrụ m ụmụ anọ; ụmụ nwoke abụọ na ụmụ nwanyị abụọ.
E jikọtara ịgba bọọlụ na agụmakwụkwọ, maka na ọ dighị mma na ị na-agba bọọlụ mana ị gaghị ụlọ akwụkwọ.
Ọ bụrụ na ị gaghị akwụkwọ, a na-agwa gị 'A', gị ana-eme 'B'.
Ọ ka mma na mmadụ nwere uche akwụkwọ na nke bọọlụ; ihe anyị na-akpọ egwuregwu na agụmakwụkwọ.



