Akụkọ dị mkpa - Julaị 16, 2026
Akụkọ dị mkpa - Julaị 16, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Francis Nweze bụ ọnụ na-ekwuru Dave Umahi agwala BBC na ya nụrụ na Mary Wisdom a sị nwụrụ n'ụlọ minista na-ahụ maka ọrụ na-enwe ọnọdụ ahụike "hormonal imbalance" tupu ọ nwụọ.
- O kwuru nke a dịka ndị mmadụ na-ebo Umahi ebubo ikpuchi ọnwụ nwaagbọghọ ahụ n'agbanyeghị na ọ pụtara kwuo na ya kwadoro ime nnyocha "autopsy" iji chọpụta ihe gburu ya.
- Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abụja enyela iwu ka onye bụbu Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa na Minista ikpe ziri ezi bụ Abubakar Malami gbahapụ akụnaụba iri anọ na asatọ a sị o nwere.
- Ọkaikpe Joyce Abdulmalik nyere iwu a dịka ọ nabatara arịrịọ ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego na Naịjirịa bụ EFCC, ndị kwuru na Malami jụrụ ịzara ọnụ ya gbasara akụnaụba ndị ahụ ha na-ebo ya ebubo na o ji ụzọ iwu na-akwadoghị nweta.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






