Ihe ị ga-eme iji gbochie CAC ịkagbu aha ụlọọrụ gị
Ụlọọrụ Corporate Affairs Commission (CAC) ewepụtala aha ụlọọrụ otu narị puku ha ga-akagbu aha ha n’akwụkwọ ndekọ ụlọọrụ dị na Naịjirịa.
CAC bụ ụlọọrụ na-edebanye aha, achịkọta ma na-enye ụlọọrụ ikike na Naịjirịa, kwuru na a chọpụtara na ụlọọrụ otu puku narị a anaghị akwụ ụtụisi ha kwesịrị ị na-akwụnye n’akpa gọọmenti.
Ha kọwara na ha na-eme nke a iji chọpụta ụlọọrụ adịgboroja e nwere na Naịjirịa ma kpochapụ ahụ.
Mana gịnị nwere ike eme ka ụlọọrụ CAC kagbuo aha ụlọọrụ gị n'akwụkwọ ha?
CAC nwere iwu dị iche iche ụlọọrụ ọbụla kwesịrị irube isi na ya.
Otu n’ime ya bụ iwu ụtụisi a kpọrọ Unified Annual Returns n’olu Bekee. Iwu kwuru na ụlọọrụ ọbụla aha ha dị n’akwụkwọ CAC, ga na-akwụ ụgwọ ụtụisi ha n’oge ya. Ụlọọrụ ọbụla nupuru isi nye iwu, CAC ga-akagbu aha ha.
Ọzọ bụ ịnọ nkịtị ruo ọtụtụ oge bekee kpọrọ, 'prolonged dormancy', nke pụtara na ụlọọrụ ọbụla na-enweghị ihe ha na-eme ruo ihe dịka afọ iri maọbụ karịa, CAC nwereike ịkagbu aha ụlọọrụ a n'akwụkwọ ndekọ ha.
Ụlọọrụ ọbụla na-ekwughị onye kachaa nwee ikike na ya nke bekee kpọrọ, 'persons with significant control (PSC), na-ada iwu CAC.
Ọzọ dịka ibe ya bụ nrụrụaka. CAC ga-akagbu ma napụ ụlọọrụ ọbụla a chọpụtara na ha mere maọbụ sonye na nrụrụaka n'ụdị ọbụla ikike e nyere ha ma kagbuo aha n'akwụkwọ ndekọ ha.
CAC wepụtara ozi n'ụbọchị Wenezde 15 Julaị 2026 ma kwuo na iwu Companies and Allied Matters nke afọ 2020 nyere ha ikike ịkagbu aha ụlọọrụ ọbụla dara iwu ha.
Kedụ usoro CAC ji akagbu aha ụlọọrụ?
Tupu a kagbu aha ụlọọrụ ọbụla, CAC ga-ewepụta aha ụlọọrụ ndị ha chọrọ ịkagbu ma nye ha abalị iri itoolu ka ha weta nzaghachi ha.
Nzaghachi a bụ iji nye ụlọọrụ dị etu a ohere idozi akwụkwọ ụtụisi maọbụ mezie iwu CAC ha dara.
Ọ bụrụ na ụlọọrụ dị etu a ewetaghị nzaghachi ha n'ime oge e nyere ha, CAC ga-aga n'ihu kagbuo aha ha n'akwụkwọ ndekọ ha.
Ụlọọrụ ọbụla CAC kachapụrụ aha ha n'akwụkwọ ndekọ ha agaghị enwe ikike ịrụ ọrụ maọbụ soro ụlọọrụ ọzọ rụkọọ ọrụ na Naịjirịa.
Gịnị ka ụlọọrụ CAC sị na a ga-akagbu aha ha ga-eme?
Ụlọọrụ aha ha so na ụlọọrụ otu puku narị a, nwere abalị iri itoolu iji kwụzuo ụtụisi ha ma gosi CAC ihe akaebe gosiri na ha emeela ya.
CAC kwuru na ha ga-akagbu aha ụlọọrụ ọbụla na-emeghị nke a n'ime oge ha nyere.



