Burkina Faso ewerela afọ ise gbatịa oge ọchịchị ndịagha
Ebe foto si, Reuters
Ọchịchị ndịagha
Burkina Faso amaala ọkwa na ha ga-eji afọ ise gbatịa oge ọchịchị ha.
E kwupụtara
nke a n’ụbọchị Satọde n’oge e nwechara nzukọ mkpọtụrụ mba ahụ n’isi obodo ya bụ
Ouagadougou.
Ụlọ
mgbasaozi Burkina Faso mere ka anyị mata nke a.
Onyeagha
na-achị mba ahụ bụ Kaptịn Ibrahim Traoré ga-enwekwa ohere isoro zọọ ọkwa onyeisiala
a ga-ahazi na ngwụcha afọ ise ahụ.
Dịka o siri
kwuo, nkwekọrịta ọhụrụ nke Kaptịn Traoré bịanyere aka na ya kwuru na oge nnyefe
ọchịchị ahụ bụ ọnwa iri isii ga-amalite n’abalị abụọ nke ọnwa Julaị, afọ a.
N’oge o
weghaara ọchịchị ihe dịka afọ abụọ gara aga, Kaptịn Traoré kwere nkwa iweghachi
ọchịchị ndị nkịtị n’abalị mbụ nke ọnwa Julaị, afọ a.
Mana ka ọ dị
ugbua, Burkina Faso esonyerela ndị agbataobi ya bụ Mali n’ịgbatikwu oge ọchịchị
ndịagha.
Burkina Faso
nọ n’okpuru ọchịchị ndịagha kemgbe ọnwa Jenụwarị 2022 bụ mgbe Lt Col Paul-Henri
Damiba napụrụ onyeisiala mba ahụ bụ Roch Kaboré ọchịchị n’ike.
Anyị achụọla Julius Abure dịka onyeisioche – Labour Pati nke Edo steeti; Ọ bụghị eziokwu – Isi ụlọọrụ Labour pati
Ebe foto si, Labour Party website
Ngalaba Labour Pati n’Edo steeti na-ekwu
na ya achụọla Julius Abure dịka onyeisioche otu ahụ na Naịjirịa.
Onyeisioche Labour Pati n’Edo steeti
bụ Kelly Ogbaloi kpuhere nke a n’oge ọ na-agụpụta akwụkwọ ozi abụọ e jiri chụpụ
Abure n’Arue Ward 3, okpuruọchịchị Esan North East nke steeti ahụ.
Dịka Ogbaloi siri kwuo, ndị isi ọchịchị
Labour pati n’Edo steeti enweghị ihe ọzọ ha maara ha ga-eme karịa ịnabata mkpebi
Arue Ward 3, Uromi, okpuruọchịchị Esan North East nke Edo steeti.
Ebe foto si, Labour Party website
Mana ka osiladị, n’ozi Labour Pati
bipụtara n’ọbaozi ya n’ụbọchị Satọde 25 Mee 2024, ha kọwara akụkọ ahụ na-ekwu
na achụọla Abure na Ward 3, Arue, Utomi, Esan North East nke Edo steeti dịka
okwu ụgha.
Dịka odeakwukwo mgbasaozi otu ahụ na
Naịjirịa bụ Obiorah Ifoh siri kwuo, iwu otu ahụ kwuru na ọ bụ naanị nnukwu
ogbakọ otu Labour nke ụzọ abụọ n’ime atọ ya kwetara ka achụpụ onyeisi ya ga-enwe
ike ime nke ahụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na wọọdụ, okpuruọchịchị
maọbụ steeti enweghị ikikere ọbụla n’okpuru iwu ịchụpụ onyeisioche otu ahụ.
Red Cross Orphanage: Gọọmentị Enugwu enyela ụmụaka ndị a ọnọdụ ọhụru ka akụkọ BBC pụtachara
Nwataakwụkwọ onyenkuzi ya pịanyere n'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma anwụọla
'Ịma ikpe ọnwụ agaghị akwụsị mbụbata ọgwụike na Naịjirịa'
Mba dị n' Ọdịda Anyanwụ Afrika otu ezinaụlọ nọ n'ọchịchị kemgbe afọ 60
Cybersecurity Levy: Ihe i kwesịrị ịma banyere ụtụ ọhụrụ a
Lee etu ị ga-esi mara onye bara otu nzuzo
Ndị uweojiiAnambra steeti na otu
ha hiwereịjị gbasaaọzị megịde ịbanye otu nzuzo a kpọrọ POCACOV depụtara ihe dị icheiche ị nwere ike ịjị mara oge nwatakịrị banyere n’otu nzuzo.
·Ilee
anya ka nwatakịrị si akpa agwa: ọ bụrụ na nwatakịrị bụ onye na-ekwuokwu ọfụma bịdọ na-emechi ọnụ, kwụsị ikwu okwumaọbụ onye na-akpa aghara bido na-anọ nwayọọ nke a bụ
otu njirimara ma bụ ihe na-arụtụ aka na nsogbụ dị.
·Nwata
na-ajụ ajụjụ gbasara otu nzuzo: ọ
bụrụ na nwatakịrị bido na-ajụ ajụjụ gbasara otu nzuzo, maọbụ na-akpa nkata gbasara otu dị icheiche, nke a na-arụ aka na nsọgbụ dị.
·Ka
nwatakịrị sị eme na ọ hụ ngwaagha: ọ bụrụ na nwatakịrị na-atụ nnukwu ụjụ ma ọ bụ nwee nnukwu mmasị iweta ngwaagha nke ya, nke a bụ ịhe nrụtụaka.
·Ka
nwata si eme ndị mejọrọ ya: ọ bụrụ na nwata bịdo na-an̄ụ iyi na ya ga-emegwara ndị mejọrọ ya, mara na nke a nwereike iduba ya n’otu nzuzo.
·Mmaya
na ọgwụike: nwata nọkata malịta n’ike bịdọ na-anụ ọgwụike na oke mmanya mara na ọ bụ otu
ihe na-egosiputa agwa ndị otu nzuzo.
·Ịgbapụ
n’ụlọ: Ọ bụrụ na nwata bịdọ na-agbapụ n’ụlọ ma nọọ ebe nne na nna ya amaghị abalị ole ma ole, mara na nke a sọ n’ihe njirimara ndị otu nzuzo.
·Akwa ọ na-ahụ n’anya: lee anya mara na oge o bịdọrọ na-ahụ otu akwa n’anya sịte n’akwa ọ na enyị, ịhe ngbanaaka na ịhe ndị ọzọ, mara na nke a sọ.
·Ka ya
na ndị enyi ya sị ekwe n’aka: ndị otu nzuzu niile nwere etu ha sị ekwe n’aka. Tinye anya mara oge nwa gị bịdọrọ na-ekwe n’aka n’ụzọ na-edoghị gị anya.
·Ihe ọ
na achọ na ịntanet: Ọ bụrụ na nwatakịrị bịdọ na-achọ etu esi emerụ mmadụ ahụ na ịntanet nakwa soshal midịa mara na nsọgbụ dị.
Ihe ọnụ na ekwuru
ndi Uweoji n’Anambra steeti kwuru
Ọnụ na ekwuru ndị
uweoji bụ Tochukwu Ikenga bụ onye zịpụrụ ụsọrọ e jị amara ndị nọ otu nzuzo dịka
POCACOV sịrị deputa kwuru na ọ dị mma ka ezinaụlọ gbadọ anya ma hara ilepu anya ka ụmụ ha sị akpa agwa, ọkachasị ihe
mgbanwe na ndụ ụmụ ha.
Tochukwu kwụpụtara
ihe mere ndị mmadụ jị abanye otu nzuzo dịka oke ịchụ ego, ndị enyi na eduhie enyi ha ụzọ na ịhe
ndị ọzọ.
N’ọkwụ ya “ụmụaka ike ụwa gwụgọrọ na ndị ịwe na-ewe maka na ezinaụlọ ha eletaghị ha anya ma meere ha ihe ha chọrọ nwereike ịba otu nzuzo ka ha were ya bọọọbọ ma mekpaa ndị obodo ahụ”.
Ọ gara n’ịhụ kwụọ
na ka nne na nna mmadụ sị akpa agwa nwereike ịme ka nwatakịrị banye n’otu nzuzo na ọ bụrụ na onwere onye nọ n’ụdụrị ajọ otu ahụ n’ezinaụlọ ya.
Mahamat Deby, onyeisi ndịagha Chad emeriela na ntụliaka onyeisiala
South Africa: Ihe ha tụrụ anya afọ 30 na nnwereonwe ga-ewetara ha o mezuola?
Hope Uzodimma: Iwu Naịjirịa ọ kwadoro Gọvanọ ịhọpụta onwe ya dịka kọmịshọna?
"Ndị PDP Imo steeti niile so Ihedioha aga ebe ọbụla ọ na-aga" - Barr. Kissinger
Etu e si lie Chukwuemeka Ezeife (Okwadike) bụbu Gọvanọ Anambra Steeti
Lee ndị Gọvanọ chiburu ha na EFCC na-agba egwu surugede ugbua
Nnamdi Kanu ekwughị na ọ gaghị apụta maka ikpe ya maọbụrụ na e meghị ihe ọ chọrọ- Ejimakor
'Emere m mmehie, ọ bụghị DJ Switch ka anyị nwụchiri ọ bụ DJ Commissioner', Benjamin Hundeyin arịọla DJ Switch na BBC mgbaghara
Ụlọọrụ
na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Kano Steeti ekwuola na ya agbaala akwụkwọ
ọhụrụ megide aka chiburu Steeti ahụ bụ Abdullahi Ganduje n’ihi nrụrụakaego na ọchịchị
ọjọọ.
Onyeisioche
ụlọọrụ ahụ bụ Muhuyi Magaji kwupụtara nke a n’ụbọchị Tuzde 16 Eprel 2024 n’ihe
omume ụlọọrụ mgbasaozi Channels.
Dịka o siri
kwuo “Ihe a na-eme ugbua ka bụ mmalite ya. Dịka m na-ekwu okwu ugbua, anyị
na-enyocha ebubo metụtara ego ọchịchị ime obodo dị ijeri Naịra 51.3 bụ nke ewepụrụ
n’akpaego gọọmenti ma kwụbanye n’akpaego mmadụ nkịtị.”
Magaji boro
gọọmenti Ganduje ebubo ịwepụ otu ijeri Naịra n’akpaego gọọmenti Kano Steeti dịka
ọ fọdụrụ naanị otu ọnwa ka ọ pụọ n’ọkwa ọchịchị na Mee 2023 mana ego ahụ bụ nke
ezigara n’aka ndị mgbanwerịta ego ‘Bureau de Change’ na-abụghị maka ọrụ okporoụzọ
eji mawapụta ya.
Ọ gara n’ihu
sị “anyị nwere okwu banyere ijeri Naịra 4 e sitere n’akpaego Kano Steeti zigaa
n’ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ubi. Okwu ndị a niile nọcha n’ihu ụlọikpe.”
Magaji
kwuru na ọ bụ eziokwu na Ganduje họpụtara ya dịka onyeisioche ụlọọrụ ahụ, na ya
agaghị ala azụ iwepụ okwu ọbụla metụtara ime nrụrụaka nke gọọmentị ahụ pụrụ apụ
n’ụlọikpe.
Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye pati 'APC' na ‘Ward’ ya
Ebe foto si, ABDULLAHI GANDUJE
Nkọwa foto, Akwụsịtụla Ganduje ị bụ onye otu APC na ‘Ward’ ya
Akwụsịtụla
onyeisioche ‘All Progressives Congress’ (APC) bụ Abdullahi Ganduje ị bụ
onye pati ahụ na wọọdụ ya dị n’okpuruọchịchị Dawakin Tofa na Kano Steeti.
Ndị isi ọchịchị
wọọdụ Ganduje nke onyeisioche ya bụ Haruna Gwanjo kpuhere nke a n’oge ọ na-agwa
ndị ọrụ mgbasaozi okwu na Kano n’ụbọchị Mọnde 15 Eprel 2024.
Gwanjo sịrị
na Ganduje, onye bụụrụ aka na-achị Kano Steeti kwesịrị ịgọpụ onwe ya n’ebubo nrụrụakaego e boro ya banyere akwụkwọ ego Dọla.
Cheta na ụlọikpe ukwu dị
na Kano nọọrọ n’abalị 9 Eprel 2024 tinye abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a
ga-ekpe Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi
ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.
Ndịagha Naịjirịa ekwuola okwu maka mwakpo e mere n'ụlọọrụ gọvanọ Oyo Steeti