Chukwuma Soludo anatala asambodo mmeri ya n'Awka
Ụlọọrụ Inec enyefeela asambodo mmeri n'aka Chukwuma Soludo n'ụbọchị Fraịde n'Awka.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ụlọomeiwu Ebonyi enweghị ikikere ịmachi ọgbakọ ‘crusade’ - Ụkọchukwu
Ihe anyị ma maka Thomas Crooks bụ onye nwara igbu Donald Trump
NDLEA ejichiela ọgwụike e zoro n’ime akpụkpọụkwụ na Lagos

Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Ụlọọrụ na-ebu agha megide ịṅụ na ire ọgwụike bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ejichiela ogogo ọgwụike cocaine dị iche iche gụnyere tramadol, pentazocine, morphine sulphate, ketamine na ọtụtụ ndị ọzọ.
Ozi ọnụ na-ekwuru NDLEA bụ Femi Babafemi wepụtara n’ọbaozi ụlọọrụ ahụ n’ụbọchị Sọnde 14 Julaị 2024, kọwara na e zoro ọgwụike ndị ahụ n’ime akpụkpọụkwụ, akwa na ngwongwo ndị ọzọ a chọrọ ịtụga mba Amerịka na Saịprọs.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, ọ bụ ndị ọrụ NDLEA nke ngalaba Directorate of Operations and Investigations (DOGI) nyopuru ọgwụike ndị ahụ na Legọs steeti.

Ebe foto si, NDLEA/Facebook
N’otu aka ahụ, ndị ọrụ NDLEA jichikwara ọgwụike loud arụ ya dị 440 gram nke e si Kanada atụbata Legọs steeti.
Ka osiladị, ndị ọrụ NDLEA nọọrọ n’ụbọchị Wenezde 10 Julaị 2024 jichie otu ụgbọala na mpaghara Ewu Junction dị n’Okpuruọchịchị Esan Central oge ha nwetara kepukepu banyere ya.
Oge ha mere nnyocha, ha chọpụtara na otu n’ime ndị njem nọ n’ime ụgbọala ahụ bụ Aminu Abdullahi gbara afọ iri atọ na abụọ (32) kwajuru ọgwụike tramadol dị puku atọ (3,000) n’ime iko custard.
Mgbe a gbara ya ajụjụ, ọ sịrị na ya zụtara ọgwụike ndị ahụ n’Ọnịcha dị n’Anambra steeti ma buru ya na-aga Mararaba dị n’Abụja ebe ọ chọrọ ịga ree ya.

Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Nnwereonwe Okpuruọchịchị ga-ebupụrụ anyị ibu arụ - Ndị gọvanọ
Onyeisi ndị uweojii na Kenya agbaala arụkwaghịm
Ndị a ma ama na-azọ ọkwa Onyeisiala mba Ghana na ndị osote ha
Nnamdi Kanu ahapụghị okwu nnwereonwe Biafra, ọ ga-agba ụtụ n’ụlọmkpọrọ - Primate Ayodele
Afọ 25 ọchịchị onyekwuoucheya: Kedụ ebe ndị ji ọgbọ n'afọ 1999 nọ ugbua?
Ahọpụtala Massoud Pezeshkian dịka onyeisiala Iran

Ebe foto si, Reuters
Ahọpụtala Massoud Pezeshkian dịka onyeisiala ọhụrụ nke mba Ịran dịka o merichara Saeed Jalili nke otu Conservative.
Okwe ntụliaka ahụ gosiri na Pezeshkian nwetara pasenti vootu iri ise na atọ na ụma atọ (53.3%) iji merie Jalili nwetara pasenti vootu iri anọ na anọ na ụma atọ (44.3%) nke ọnụọgụ vootu karịrị nde iri atọ (30m) a tụrụ na Ịran.
A haziri ntụliaka ahụ dịka onye bụbu onyeisiala Iran bụ Ebrahim Raisi nwụrụ na mkpọka ụgbọelu helikọpta n’ime ọnwa Mee.
Pezeshkian gbara afọ iri asaa na otu (71) bụụrụ dọkịta na-awa obi nakwa onye omeiwu Ịran tupu ahọpụta ya dịka onyeisiala.
O kwere nkwa na ya ga-eweta udo na ịdịnootu ma hụkwa na Ịran kwụsịrị iwezuga onwe ya iche na mbaụwa.
Ihe mere ndị ndu Ọwụwa Anyanwụ ji akpọ oku ka a tọhapụ Nnamdi Kanu
Nsogbu nchekwa, Nnamdi Kanu na ihe ndị ọzọ Gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpara na nzukọ ha
Agha mba Sudan: Anyị na-eri nri naanị otu mgbe kwa ụbọchị
Minimum wage: Ndị gọvanọ agaghị ekpebiri anyị ụgwọọnwa ha ga-akwụ - NLC

Ebe foto si, NLC/X
Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) akatọọla okwu ahụ a sị ndị gọvanọ kwuru na steeti ọbụla kwesịrị ikpebi ego ole ha ga-akwụ dịka ụgwọọnwa opekatampe na steeti ha dị iche iche.
Ndị otu ahụ kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024 n’ozi sitere n’aka onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi ha bụ Benson Upah.
Dịka Benson Upah siri kwuo, ụdị mkpebi dị etu ahụ bụ nke na-agba ụkwụ megide ebumnoobi e ji nabata ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa.
O kwukwara na ọ bụ ihe na-agba anyammiri na mgbe ụfọdụ gọọmenti na-ahụta ụgwọọnwa ndị ọrụ dịka ihe ọma a na-emere ha karịa ụgwọọrụ maka nrụsi ọrụ ike.
NLC gbara onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ume ka ọ hara ikwe ka ụfọdụ ndị gọvanọ na-ebughị ọdịmma Naịjirịa n’obi mee ya ka o chefuo ihe gbasara ụgwọọnwa obibi ndụ o kwere ndị ọrụ na nkwa.
Cheta na otu e hiwere maka iwepụta ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ kwupụtara puku naịra iri isii na abụọ (N62,000) dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ebe ndị ọrụ gbara isi akwara sị na ha chọrọ narị puku naịra abụọ na iri ise (N250,000).
Tinubu enyela iwu ka ewepụta N155bn maka ịzụta ihe oriri gburugburu Naịjirịa

Onyeisiala Naịjirịa bụ Ahmed Bola Tinubu enyela iwu ka azụta ma kesaa ihe oriri ruru otu narị ijeri naịra na iri ise na ise (N155bn) gburugburu Naịjirịa.
Tinubu nyere iwu ahụ n’Abuja oge otu na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa bụ National Economic Council (NEC) nwere nzukọ n’ụbọchị Tọzde 27 Juun 2024.
N’oge ha na-enwe nzukọ ahụ, onyeisiala gwara ndị gọvanọ ka ha gbakọta aka n’ọrụ iji mezuo ọchịchọ obi ndị ha na-achị.
N’ozi ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Ajuri Ngelale tinyere aka na ya, Tinubu kwuru na ya dị nkwadobe ịrọpụta enyemaaka niile a chọrọ iji hụ na a napụtara ụmụafọ Naịjirịa n’ọnọdụ iheisiike.
Ọzọ dị ka ibe ya bụkwa na Onyeisiala enyela nkwado ka e kesaara ezinaụlọ otu narị puku (100,000) na steeti ọbụla puku naịra iri ise (N50,000) ruo ọnwa atọ.
Ndị ojiegbe agbagbuola mmadụ isii na mpaghara Garki dị n’Okigwe, Imo Steeti
Kedụ ihe mmeri Trump ga-emere mbaụwa?
A họpụtala onye ọkpaọchị dịka Osote Onyeisiala ọhụrụ nke mba Malawi
Ụlọikpe akagbuola nkpọghachị a kpọghachịrị Muhammadu Sanusi n'ọkwa Emir Kano
E duola Cyril Ramaphosa n’iyi ọrụ ugboro abụọ dịka Onyeisiala mba Saụt Afrịka
