You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chukwuma Soludo anatala asambodo mmeri ya n'Awka
Ụlọọrụ Inec enyefeela asambodo mmeri n'aka Chukwuma Soludo n'ụbọchị Fraịde n'Awka.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ihe omimi etu e si degharịa mpụtara ntuliaka n'ụfọdụ ebe na Naịjirịa
Kosi kara imalite inyere m aka na nleta nna ya dara ahụ kemgbe afọ 26 – Nne nwaada a magburu
Imo state: Gọọmenti Naịjirịa amalitela ịkwara mmiri Oguta/Orashi ụzọ banye n'osimiri Atlantic
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo agbapeela ọrụ imalite ịkwara mmrịrị Oguta na Orashị dị n'Imo steeti ka ọ banye nke ọma na nnukwu mmiri mba ụwa bụ Atlantic Ocean.
Osinbajo kwuru na ya bụ ọrụ, nke a kpọrọ "Oguta/Orashi River development project", bụ nke ga-eweta ezigbo mmepe na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Ya bụ mmemme ka e mere ụnyaahụ Tọzde 11th Mee 2023 n'okpuru ọchịchị Oguta dị n'Imo steeti.
Osinbajo kwere nkwa na ya bụ "dredging" a malitere na mmiri Oguta bụ iji kwalite azụmahịa na mmekọrịta n'etiti ndị Igbo na obodo ndị ọzọ n'Afrịka nakwa n'ụwa niile.
O kwuru na ndị so na ya bụ nkwekọrịta gụnyere ndị ọrụ agha Naijirịa, gọọmenti Imo steeti, nakwa gọọmentị etiti nke onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'isi ya.
N'okwu nke ya, onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Chief Emmanuel Iwuanyanwu kwuru na obi dị ya ụtọ na ụdị mmepe a a na-achọ ka mgbe amalitela, were rịọ ka arụruo ya n'isi njedebe.
Iwuanyanwụ jikwa ohere ahụ rịọ ka onyeisiala Buhari tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu tupu orituo n'ọkwa na Mee 29th.
Onye ji ọkwa Chief of Naval Staff, bụ Vice Admiral Awwal Gambo, kwuru na ya bụ "dredging" nke mmiri Oguta /Orashi ga-akwalite akụnụba Imo nakwa Naịjirịa wee kelee gọọmenti ka o siri nye ndị ọrụ Navy ọrụ nchewa ebe ahụ.
Gọvanọ Hope Uzọdimma dugharịrị ndị niile zukọrọ na ya bụ ebe ịgba akaebe na ọrụ amalitela.
Igbo culture: Ịtụ nzu, ịji akwụkwọ ube machie nkwụelu na ihe nrịbama ndị ọzọ dị omimi n'Ala Igbo na ihe ha pụtara
Supreme Court: Ihe ndị mere taa n'Ụlọikpe Kachasị n' ikpe Atiku,Obi megide Tinubu
Ana m enyefe mmeri m n'aka Chukwu nakwa ndị Osun - Gọvanọ Ademola Adeleke
Ndị uweojii anwụchiela ndị a sị ji mmanwụ chụpụ otu nwaanyị n'Ogbaru, Anambra
Election Tribunal: E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka Ntuliaka 2023
Kedụ mba ndị nọ na Commonwealth nke Eze Charles III bụ onyeisi ya?
Ike Ekweremadu : Ihe ndi ị maghị maka 'Belmarsh Prison',ụlọmkpọrọ ebe Ekweremadu nọrọ oge ikpe ya
Ike Ekweremadu:Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu dịka a tụrụ Ekweremadu mkpọrọ
NLC Strike: Oku adịghị, ụgbọelu efeghị dịka NLC,Gọọmentị Imo na-ama aka
Chinedum Orji ga-aga n’ihu buru onyeisi ụlọomeiwu Abia steeti
Subsidy Removal: Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ya
Presidential Election Petition: E hiwela ụbọchị ikpe ntuliaka dị n'etiti Tinubu, Obi na Atiku ga-ebido
Arịrị egbuola ezinụlọ anyị - Nwunye Obiora Agbasimalo a na-achọ achọ kamgbe afọ abụọ
Ihe i kwesịrị ịma maka iwu nwereike igbochi ndị dọkịnta ịhapụ Naịjirịa achụ akaraka ha n'ofesi
Eduola Emmanuel Iwuanyanwu n'iyi ọrụ dịka onyeisi ọhụrụ nke Ohaneze Ndigbo
Ọ bụ eziokwu na nkewa abatala n'ime 'Labour Party' Imo Steeti?