Etu ngagharịiwe ndị ntorobia si malite n'India

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

A na-acha gọọmentị mba Indịa ọkụ dịka nde kwuru nde ndị otu pati a kpọrọ 'Cockroach Janta Party' (CJP) gara n''ihu na-eme ngagharịiwe maka ọnọdụ agụmaakwụkwọ na mba ahụ.

Ha na-eme ngagharịiwe n'agbanyeghị oke mmiri ozuzo tupu chi efo.

Otu pati ahụ nke ndị ntorobia hiwere chọrọ ka a hazie agụmakwụkwọ nakwa ka Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Dharmendra Pradhan gbaa arụkwaghịm.

Ngagharịiwe malitere n'ụbọchị Monde dịka nde kwuru nde ndị ntorobia ma nwoke, ma nwaanyị wujuru ama n'isiobodo mba India bụ Delhi.

Ha gara n'ụlọomeiwu mba ahụ na-agbanyeghị na ndị uweojii machiri ngagharịiwe ahụ.

Opekatampe mmadụ 60 merụrụ ahụ dịka ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsaa ndị mmadụ ma kụsaa ochendo ndị na-eme ngagharịiwe wubere.

Ndị uweojii kwuru na ndị ọrụ ha mmadụ 118 merụrụ ahụ, ma kwụkwaa na ha nwụchiri ndị ngagharịiwe mmadụ 70.

Mana kama ibeleta maọbụ dajuo, ngagharịiwe ahụ kporoọkụ gaa n'ihu dịka ndị pati anọghị na gọọmentị kachasị sonyere na ngaghariwe a mere n'ihu ụlọ Praịm Mịnịsta mba ahụ.