You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ntuliaka 2027: Ihe isii gbanwere kemgbe e mere ntuliaka ikpeazụ na Naịjirịa
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 12
Ndị Naịjirịa na-akwado maka ntuliaka nke afọ 2027, mgbe a na-atụ anya na nde kwuru nde mmadụ ga-atụ vootu iji họpụta onyeisiala, ndị gọvanọ steeti, nakwa ndị omeiwu nke gọọmenti etiti na nke steeti.
Mgbe ndị Naịjirịa mere ntuliaka ikpeazụ n'afọ 2023, ọtụtụ mmadụ kwenyere na teknụzụ ọhụrụ e webatara maka ntuliaka, nnukwu ọnụọgụ ndị ntoroọbịa sonyere n'ịtụ vootu nakwa asọmpi siri ike n'etiti mmadụ atọ zọrọ ọkwa onyeisiala, nwereike ime ka ọchịchị onye kwuo uche ya sikwuo ike na mba ahụ. Mana nsogbu teknụzụ metụtara ịntanetị nke e ji elele mpụtara ntuliaka n'ọbaozi INEC (IReV portal) mere ka ntụkwasịobi ọhanaeze belata ngwa ngwa.
A kpọpụtara Bola Tinubu nke pati na-achị achị bụ All Progressives Congress (APC), dịka onye meriri ntuliaka ahụ a kachasị maa aka na ya n'akụkọ ihe mere eme Naịjirịa. Ndị kachasị maa ya aka bụ Atiku Abubakar nke People's Democratic Party (PDP) na Peter Obi nke Labour Party (LP), gbara ụkwụ megide mpụtara ntuliaka ahụ, mana n'ikpeazụ, Ụlọikpe Kachasị kwadoro mmeri Tinubu.
Afọ anọ ka e mesịrị, Naịjirịa na-alaghachi ọzọ ime ntuliaka n'ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị na nke akụnaụba dị iche na nke gara aga.
Iwu gbasara ntuliaka agbanweela, pati na-achị achị agbasaala, ebe ndị ga-atụ vootu na-agabiga ịmaaka ọhụrụ gbasara ajọ ọnọdụ obibi ndụ, nsogbu nchekwa, na ụkọ ọkụ latrik. N'otu oge ahụkwa, ọgbọ ọhụrụ nke ndị ntoroọbịa ga-atụ vootu ga-arụkwa ọrụ dị oke mkpa ọzọ n'ịgbanwe ọdịnihu mba ahụ.
Lee ụzọ isii Naịjirịa si gbanwee kemgbe ntuliaka onyeisiala ikpeazụ.
Iwu ntuliaka agbanweela
Ntuliaka onyeisiala nke afọ 2023 nwetara nnukwu nkatọ mgbe ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) na-enweghị ike itinye mpụtara ntuliaka sitere n'ogige ntuliaka ozugbo n'ọbaozi ha bụ Result Viewing Portal (IReV), n'agbanyeghị na e webatara usoro ahụ iji mee ka ntuliaka bụrụ nke doro anya ma nwee ntụkwasịobi karịa.
N'ọtụtụ oge a haziri ntuliaka gọvanọ na ndị omeiwu steeti mapụrụ iche n'afọ 2022, usoro ahụ rụrụ ọrụ nke ọma karịa. Mana nsogbu ndị pụtara n'oge ntuliaka onyeisiala, nke INEC kwuru na ọ sitere na "nsogbu teknụzụ" (technical glitch), mere ka ọtụtụ ndị Naịjirịa malite ịjụ ajụjụ gbasara ntụkwasịobi nke usoro ntuliaka ahụ.
N'ịzaghachi ihe ndị a, Iwu Ntuliaka 2026 (Electoral Act 2026) webatara usoro ọhụrụ nke chọrọ ka ndị isi na-ahụ maka ogige ntuliaka bụ Presiding Officers zipu mpụtara ntuliaka n'ụzọ elektrọnik gaa na IReV mgbe e mechara, bịanye aka na ya ma tinye akara ọchịchị n'akwụkwọ mpụtara ntuliaka bụ Form EC8A, dịka mpaghara 60(3) nke iwu ahụ siri kwuo.
Ka ọ dị, iwu ahụ ka kwadokwara iji aka dee mpụtara ntuliaka ma ọ bụrụ na e nwere nsogbu n'ikuku nzirịtaozi maọbụ ịda mba nke kọmputa. Nke a bụ otu n'ime ihe ndị ka na-ebute arụmụka n'usoro ndọrọndọrọ ọchịchị.
Sam Amadi, Onyeisi Abuja School of Social and Political Thought, kwenyere na mgbakwụnye ahụ nwereike ime ka ntụkwasịobi ndị mmadụ nwere n'iwu ọhụrụ ahụ belata.
"Nkwado e nyere maka iji aka dee mpụtara ntuliaka mgbe ikuku nzirịtaozi maọbụ kọmputa dara mba nwereike ibute mgbagwojuanya n'usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n'ihi na ụfọdụ ndị ọrụ INEC nwereike ịhọrọ ka ha ghara izipụ mpụtara ntuliaka n'ihi na ikuku nzirịtaozi adịghị mma maọbụ na ọ dịghị."
N'aka nke ọzọ, INEC na-ekwu na iji ụzọ elektrọnik ezipụ mpụtara ntuliaka agaghị edochi usoroiji aka ede mpụtara ntuliaka, kama ha abụọ na-arụkọ ọrụ.
Obo Effang bụ Kọmishọna Ntuli Aka nke INEC n'Edo Steeti kwuru:
"Usoro ntuliaka Naịjirịa ka bụ nke e ji aka eme. A na-agụkọ vootu n'aka, e ji aka na-ede mpụtara ntuliaka n'akwụkwọ. Anyị na-eji ngwaọrụ BVAS see foto nke akwụkwọ mpụtara ahụ, nke bụkwa ihe a na-etinye na IReV."
O kwukwara na site n'ebe ahụ, a ka na-achịkọta mpụtara ntuliaka n'aka, site n'ogo ọchịchị ime obodo ruo na steeti na nke etiti.
Mgbe ọ na-ekwu maka iwu ọhụrụ ahụ, ọ gbakwụnyere:
"Ma ikuku nzirịtaozi ọ dị ma ọ bụ na ọ dịghị, a ga-anwa itinye mpụtara ntuliaka ahụ. Ma nke ahụ agaghị agbanwe eziokwu bụ na a ka ga-eji aka achịkọta mpụtara ntuliaka."
Ndị na-akwado mgbanwe ndị a na-ekwu na ha nwereike ime ka usoro ntuliaka bụrụ nke doro anya karịa. Ndị na-emegide ya, n'aka nke ọzọ, na-ekwu na ohere e nyere maka iji aka nwereike ibute mgbagwojuanya na obi abụọ.
Ma mgbanwe ndị a ga-enyeaka iweghachi ntụkwasịobi ọhanaeze n'usoro ntuliaka ga-apụta ìhè mgbe ndị Naịjirịa ga-atụ vootu n'afọ 2027.
Iwu ọhụrụ ahụ nabatakwara:
Ntuliaka imeụlọ nke ndị pati nwere mmasị ga-esonye (direct party primaries);
Iji usoro digitaalụ dekọọ aha ndị pati;
Kaadị ndị ntuliaka e nwereike ibudata n'ịntanetị;
Nnabata pati ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ ọhụrụ.
Nke a emeela ka ọnụọgụ pati ndọrọndọrọ ọchịchị debanyere aha ruo iri abụọ (20), gụnyere Nigeria Democratic Congress (NDC), nke bụ pati onye na-ama gọọmenti aka bụ Peter Obi ji aha ya na-azọ ọkwa onyeisiala.
Pati na-achị achị enwetakwuola ọtụtụ steeti
Ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa agbanweela nke ukwuu kemgbe ntuliaka nke afọ 2023.
Afọ anọ gara aga, ndọrọndọrọ maka ọkwa onyeisiala bụ otu n'ime ndị kachasị kemgbe Naịjirịa laghachiri n'ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999. Otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-achị achị bụ All Progressives Congress (APC), gabigara nnukwu ihe ịmaaka sitere n'aka otu People's Democratic Party (PDP) na Labour Party (LP), nke onye na-azọ ọkwa onyisi ala ya, Peter Obi, kpaliri ọtụtụ ndị ntoroọbịa na ndị na-atụ vootu nke mbụ ka ha sonye n'usoro ndọrọndọrọ ọchịchị.
Mana ka a na-akwado maka ntuliaka nke afọ 2027, nguzosiike ndọrọndọrọ ọchịchị agbanweela. Ọtụtụ ndị gọvanọ agbanweela otu ndọrọndọrọ ọchịchị ha, nke mere ka APC nweta nkwado gọvanọ iri atọ (30) n'ime steeti iri atọ na isii (36) dị na Naịjirịa. Nke a emeela ka a na-atụle ma mba ahụ ọ na-achọ ịbanye n'usoro ọchịchị nke naanị otu pati.
Ụdị ọchịchị nwere nnukwu ikike etu a emetụla na Naịjirịa mbụ. N'afọ 2007, People's Democratic Party (PDP), nke na-achị mgbe ahụ, na-achị steeti iri abụọ na asatọ (28) n'ime steeti iri atọ na isii (36) nke Naịjirịa.
Ndị na-akatọ ọnọdụ a na-ekwu na ịchikọta nnukwu ikike ndọrọndọrọ ọchịchị n'aka otu pati, n'agbanyeghị pati ji ya, nwereike ime ka ịza ajụjụ na njikwa ọchịchị onye kwuo uche ya daa mba. N'aka nke ọzọ, ndị na-akwado ya na-ekwu na ọtụtụ gọvanọ na-esonye n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke nọ n'isi gọọmenti etiti iji mee ka mmekọrịta na imekọ ihe ọnụ ka mma ma nyekwa ohere maka ịkwalite nnweta akụrụngwa na nkwado sitere n'aka gọọmenti etiti.
Nchekwa ka bụ ịmaaka gbara ọkpụrụkpụ
Nchekwa bụ okwu a kpụ n'ọnụ oge a kwado maka ntuliaka onyeisiala nke afọ 2023, ma ọ ka bụkwa otu n'ime nsogbu ndị kacha mkpa a ka a na-elekwasị anya tupu ntuliaka nke afọ 2027.
N'oge emume idu n'iyi ọrụ ya n'ụbọchị 29 Mee 2023, Onyeisiala Bola Tinubu kwere nkwa ime ka nchekwa bụrụ ihe kachasị mkpa n'ọchịchị ya, na-ekwu na "ọganihu maọbụ ikpe ziri ezi agaghị enwe ike ịga nke ọma n'etiti enweghị nchekwa na tigbuo zọgbuo." O kwukwara na ọ ga-eweta mgbanwe zuruoke n'usoro na atụmatụ nchekwa nke Naịjirịa.
Kemgbe ahụ, gọọmenti kwuru na ha agbakwunyela ndị uweojii 20,000 ọhụrụ, mụbara ego a na-etinye n'ọrụ nchekwa, ma gbanwee ndị isi ụlọọrụ nchekwa dị elu. N'agbanyeghị usoro ndị a, ịtọrọ mmadụ maka ego mgbapụta, agha ndị nnupụisi, na ime ihe ike ndị ọzọ gara n'ihu. Ihe ike a adịkwaghị naanị na mpaghara ndị a ma ama maka nsogbu nchekwa dị ka Ugwu Ọwụwa Anyanwụ (North-East) na Ugwu Ọdịda Anyanwụ (North-West), kama ọ gbasakwara ruo n'akụkụ ụfọdụ nke Ndịda Ọdịda Anyanwụ.
Iji maa atụ, na Steeti Ọyọ, ndịagha napụtara mmadụ 45, gụnyere ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi ha na nso nso a, bụ ndị a tọọrọ ma jichie ruo ụbọchị iri ise na isii (56) tupu e mee ka ha nwere onwe ha.
Otu n'ime ihe kachasị pụta ìhè n'oge ọchịchị a bụ ịtọrọ ụmụaka karịrị narị atọ (300) sitere n'ụlọakwụkwọ St. Mary's Private Catholic School n'ime Niger Steeti. Nke a bụ ntọrị ụmụakwụkwọ kachasị n'otu mgbe n'akụkọ Naịjirịa.
Dịka Acled (Armed Conflict Location & Event Data) siri kwuo, Naịjirịa hụtara ntọrị ụmụakwụkwọ ugboro iri, nke metụtara ihe dị ka ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi otu puku, otu narị na iri abụọ na asaa (1,127), n'agbata afọ 2015 na 2023. N'ime afọ atọ mbụ nke ọchịchị Tinubu, Naịjirịa ahụla ịtọ mmadụ buru ibu ugboro itoolu, nke metụtara ihe karịrị mmadụ narị ise (500).
Ndị nnyocha okwu sịrị na otu ihe ọzọ na-akpata nchegbu bụ na mwakpo ndị a amalitela ịgbasa ruo n'ebe ndị nwere nchekwa karịa n'oge gara aga.
Mmetụta nsogbu nchekwa a anaghị akwụsị naanị n'ihe gbasara nchekwa ndụ. Mwakpo ndị a na-eme n'obodo ndị ọrụ ugbo emeela ka ịkọpụta ihe ubi daa, ma nyekwa aka n'ịrị elu nke nsogbu enweghị ihe oriri. World Food Programme (WFP) na-atụ anya na ndị Naịjirịa ruru nde iri atọ na ise (35) nwereike ịnọ na nsogbu enweghị nri n'afọ 2026, ma e jiri ya tụnyere nde iri abụọ na anọ na ụma asatọ (24.8) ọ bụ n'afọ 2023.
Ka ndị Naịjirịa na-akwado ịtụ vootu ọzọ, o doro anya na nchekwa ga-aga n'ihu bụrụ otu n'ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ndị ga-eso tụọ vootu ga-eji tụlee gọọmenti dị ugbua nakwa nkwa ndị chọrọ ịnọchi anya ya na-ekwe.
Ndị Naịjirịa na-agabiga ajọ ọnọdụ obibi ndụ
Samson Itodo, Onyeisi nke ụlọọrụ Yiaga Africa, kwuru sị:
"Onye Naịjirịa ọbụla na-eche banyere ịdịmma nke ndụ ya kwesịrị inwe mmasị n'ịmata onye ga-emeri ntuliaka nke afọ 2027, n'ihi na ndị ndu ga-abata n'ọchịchị ga-eme mkpebi ndọrọndọrọ ọchịchị na akụnaụba nke ga-emetụta ọdịnihu na ndụ ndị Naịjirịa."
Nsogbu gbasara ego na ndụ kwa ụbọchị amalitelarị ịkpụzi mkparịtaụka ndọrọndọrọ ọchịchị tupu ndị Naịjirịa atụọ vootu n'afọ 2023. Afọ anọ ka e mesịrị, ọnụahịa ibi ndụ abụrụla ihe gbara ọkpụrụkpụ na mkparịtaụka gbasara ntuliaka.
N'oge emume idu n'iyi ọrụ ya, Onyeisiala Bola Tinubu kwupụtara njedebe nke enyemaka ego mmanụ ụgbọala, ma kwuo na mmefu ego o nwetara n'aka ọchịchị gara aga etinyeghị ego maka ya. Kemgbe ahụ, iwepụ enyemaka ego a na ime ka ọnụego naịra na-agbanwe dịka ahịa si chọọ ewetela nnukwu mgbanwe n'akụnaụba Naịjirịa, na-ebute mmụba n'ọnụahịa njem, nri, na mmefu ezinaụlọ.
Dịka ọnụọgụ sitere n'Ụlọakụ Etiti Naịjirịa (CBN) si gosi, ọnụego mmụba ọnụahịa dị na pasent 24.7 n'afọ 2023 tupu ọ rute n'ogogo kachasị elu bụ pasent 37.57 n'ọnwa Ọgọst 2024. Ka a na-erute Jenụwarị 2026, ọnụego ahụ belatara ruo pasent 17.18, n'agbanyeghị na ọtụtụ ndị Naịjirịa ka na-enwe nsogbu nnukwu ọnụahịa ibi ndụ.
Boniface Chizea, ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba, kwenyere na nsogbu akụnaụba obodo ahụ akawanyela njọ kemgbe ntuliaka gara aga.
Ọ sịrị:
"Naịjirịa nwere ihe niile dị mkpa iji nwee ọganihu, ma ohere mmepe ya na-ebelata n'ihi nrụrụaka, ịba ụba nke nhụjuanya, mwakpo ndị omempụ na ndị ojiegbe. Afrịka nọ n'ọnọdụ ọ nọ taa n'ihi na Naịjirịa anaghị arụ ọrụ ya nke ọma dịka a tụrụ anya."
Ọ gara n'ihu kwuo sị, n'agbanyeghị na ọnụego mmụba ọnụahịa adaala,
"Ihe adịghị njọ etu ha dị ugbua n'afọ 2023."
N'uche ọtụtụ ndị Naịjirịa, ajụjụ kachasị mkpa n'afọ 2027 nwereike ọ gaghị abụ gbasara echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị mmadụ na-akwado. Kama nke ahụ, ọ nwereike ịbụ ma obibi ndụ ọ dịla ọnụala ma dị mfe karịa ka ọ dị afọ anọ gara aga, maọbụ na ọ ka siri ike karịa.
Ọkụ latrik ka bụ nnwale maka mgbalị gọọmenti
Ọkụ latrik a pụrụ ịdabere na ya abụrụla otu n'ime nkwa ndị a na-eji atụle arụmọrụ ndị isiala Naịjirịa kemgbe ọtụtụ afọ, ma ọ ka bụkwa isiokwu dị mkpa ka a na-atụle tupu ntuliaka nke afọ 2027.
N'oge achụmtavootu maka ntuliaka nke afọ 2023, Bola Tinubu gwara ndị ga-atụ vootu sị:
"Ọ bụrụ na enyeghị m unu ọkụ latrik na-adịgide adịgide, ma m laghachikwute unu maka oge ọchịchị nke abụọ, unu atụnyekwala m vootu, ma e wezụga ma m nyere unu ezi ihe kpatara na enweghị m ike imezu nkwa a."
Kemgbe ọ banyere n'ọchịchị, gọọmenti Tinubu ewepụtala ụfọdụ mgbanwe ndị kachasị ukwuu na ngalaba ọkụ latrik Naịjirịa n'ime ọtụtụ afọ gara aga. Iwu Electricity Act na mgbanwe e mere n'Iwu Ọchịchị emeela ka steeti dị iche iche nwee ikike n'oge mbụ, ihiwe ahịa ọkụ katrik nke ha site n'ịmepụta, ibufe na ikesa ọkụ latrik na-enweghị ndabere kpamkpam n'ọkụ latrik nke mba niile.
Gọọmenti ahụ akwadokwala ego enyemaka ruru ijeri dọla abụọ na ụma anọ ($2.4bn) iji dozie nsogbu ụgwọ ndị e ji ogologo oge na ngalaba ọkụ latrik. Ebumnuche nke usoro a bụ ime ka ụlọọrụ ọkụ latrik kwusieike n'ihe gbasara ego ma kwalite ntụkwasịobi n'inye ọkụ eletrik.
N'agbanyeghị mgbanwe ndị a, ọtụtụ ndị Naịjirịa ka na-enwe nsogbu ọkụ latrik na-anyụ ugboro ugboro, ebe ha na-akwụkwa ụgwọ ọkụ latrik dị elu karịa ka ọ dị na mbụ.
Dịka ụlọọrụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) si kwuo, Naịjirịa mepụtara ihe karịrị megawat ọkụ latrik dị 4,922 n'afọ 2023. Ka ọ na-erute na Jenụwarị 2026, ihe ruru megawat ọkụ latrik 4,901 dị maka nkesa, n'agbanyeghị na ikike nrụpụta ọkụ latrik mba ahụ ruru 13,625MW.
Ka ezinaụlọ na azụmahịa dị iche iche na-aga n'ihu ịdabere n'igwe ọkụ nakwa ụzọ ndị ọzọ e si enweta ikike latrik, ọkụ latrik ga-abụ otu n'ime ihe ndị kachasị mkpa a ga-eji nyochaa arụmọrụ gọọmenti mgbe ndị Naịjirịa ga-atụ vootu ọzọ n'afọ 2027.
Ndị ntoroọbịa Naịjirịa ka bụkwa ndị vootu ha ga-ada ụda
Ndị ntoroọbịa Naịjirịa nyere aka n'ịkpụzi mkparịtaụka ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'afọ 2023, a na-atụkwa anya na ha ga-anọgide bụrụ otu n'ime ndị ga-ekpebi mpụtara ntuliaka n'afọ 2027.
Dịka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) si kwuo, ndị dị afọ 18 ruo 35 mejupụtara pasent 76 nke ndị debanyere aha ọhụrụ maka ntuliaka gara aga. Etu ọ dị, naanị pasent 30.56 n'ime ha mechara pụta ịtụ vootu.
Ọnụọgụ ndị ntoroọbịa na-edebanye aha maka ntuliaka gara n'ihu ịrị elu. N'oge ihe omume Continuous Voter Registration (CVR) nke afọ 2026, INEC gbakwunyere ndị ntuliaka ọhụrụ dị 2,782,589 na mmadụ 93,469,008 e debanyere aha ha maka ntuliaka nke afọ 2023. Nke a mere ka ọnụọgụ ndị debanyere aha ịtụ vootu rute 96,251,597 ka ọ na-eru n'ọnwa Jenụwarị 2026.
N'ime ndị debanyere aha ọhụrụ ahụ, ihe dịka pasent 69 bụ ndị ntoroọbịa.
N'agbanyeghị nke a, akụkọ ntuliaka gara aga na-egosi na nnukwu ọnụọgụ ndebanye aha anaghị emekarị ka nnukwu ọnụọgụ ndị mmadụ pụta ịtụ vootu. Nke a bụ n'ihi nsogbu dịka:
Ime ihe ike n'oge ntuliaka
Enweghị mmasị n'ịtụ vootu
Enweghị ntụkwasịobi n'usoro ntuliaka
Ihe mere mbaụwa ji na-ele anya
Ntuliaka Naịjirịa nke afọ 2027 nwere nnukwu mkpa ọ dị, nke karịrị ókèala mba ahụ. Dịka mba nwere ọnụọgụ mmadụ kachasị n'Afrịka nakwa otu n'ime akụnaụba kachasị na mpaghara ahụ, nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa nwereike imetụta azụmahịa, mbata na ọpụpụ mmadụ, nchekwa mpaghara, na itinye ego gburugburu Ọdịda Anyanwụ Afrịka nakwa akụkụ ụwa ndị ọzọ.
Ọkachamara akụnaụba bụ Boniface Chizea kwuru na nha obodo ahụ na mmetụta ọ nwere pụtara na mmetụta nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị ogologo oge agaghị akwụsị naanị na Naịjirịa.
Ọ sịrị:
"Naịjirịa bụ mba dị oke mkpa . Anyị nwere mba nwere nde mmadụ 200 nọ n'ime ya. Ọ bụghị ọtụtụ mba n'ụwa nwere ọnụọgụ mmadụ maọbụ okeala dịka nke Naịjirịa. Ya mere, ọ bụrụ na e nwee nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị, ọnụahịa ngwaahịa na-arị elu nke ukwuu, ndị mmadụ amalite ịgbapụ dịka ndị gbara ọsọ ndụ, nke ahụ ga-akụsasị mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka dum. Ọ ga-enwekwa mmetụta n'akụkụ ụwa ndị ọzọ, dịka ọnọdụ anyị na-ahụ ugbu a n'Ịran."
Maka ndị Naịjirịa, mmetụta ya ga-abịa ozugbo. Afọ anọ ka ha tụchara vootu ikpeazụ ha, ha ga-alaghachi ọzọ n'ogige ntuliaka n'ime mba nke gbanwerela nke ukwuu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, akụnaụba na mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Mgbe ha ga-atụ vootu n'afọ 2027, ọtụtụ ndị Naịjirịa ga-atụle otu ajụjụ kachasị mkpa:
Ndụ m ọ ka mma taa karịa ka ọ dị mgbe m tụrụ vootu n'afọ 2023?