Ụlọikpe atụọla Onyeze Jesus mkpọrọ afọ isii

Ebe foto si, Screengrab
Ụlọikpe Ukwu dị n'Awka isiobodo Anambra steeti atụọla onye dịbịa a ma ama bụ Onyebuchi Okocha, a maara dịka 'Onyeze Jesus' mkpọrọ afọ isii ma daa ya nha nde naira wiri abụọ(20m).
Ụlọikpe enyeghị ya ohere ịkwụ naanị nga maka ndajọ a mara ya ikpe maka ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ka e biri ikpe, Ọkaiwu Onyeze Jesu bụ Ọkaiwu Barth Ezedinobi kwuru na ha ga-aghagha mkpebi ụlọikpe ahụ.
Cheta na gọọmenti Anambara steeti nwụchiri Onyeze Jesus, Akwa Ọkụkụ na Eke Hit n'ọnwa Febụwarị 2025 maka ebubo iji akara ịhụakwụkwọ soshal midịa akwalite ụzọ na-ezighị ezi e ji akpata ego, iji ọgwụ ọtụmọọkpọ, ihiwe ụlọọgwụ adigboroja, ịkwalite ụzọ e ji enweta ego ngwa ngwa, ebubo igbu mmadụ, ime ọgwụ ọtụmọọkpọ, ịtọ mmadụ.
A malitere gụwara ya oge ọ nọ na mkpọrọ malite n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị 2026.
Chetakwa na Ụlọikpe ahụ nọrọ n'ụbọchị Fraịde 27 Febụwarị 2026, tụọ Chidozie Nwangwu a ma ama dịka 'Akwa Ọkụkọ' mkpọrọ ọnwa iri na otu maka ebubo metụtara ịgwọrọ ndị mmadụ ọgwụ ego nke a kpọrọ 'Oke Ite'.
Akwa Ọkụkọ kwetara n'ebubo ndị e boro ya tupu ọkaikpe nye mkpebi ahụ.


























