Ụlọikpe atụọla Onyeze Jesus mkpọrọ afọ isii

Foto Onyeze Jesus

Ebe foto si, Screengrab

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe Ukwu dị n'Awka isiobodo Anambra steeti atụọla onye dịbịa a ma ama bụ Onyebuchi Okocha, a maara dịka 'Onyeze Jesus' mkpọrọ afọ isii ma daa ya nha nde naira wiri abụọ(20m).

Ụlọikpe enyeghị ya ohere ịkwụ naanị nga maka ndajọ a mara ya ikpe maka ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ka e biri ikpe, Ọkaiwu Onyeze Jesu bụ Ọkaiwu Barth Ezedinobi kwuru na ha ga-aghagha mkpebi ụlọikpe ahụ.

Cheta na gọọmenti Anambara steeti nwụchiri Onyeze Jesus, Akwa Ọkụkụ na Eke Hit n'ọnwa Febụwarị 2025 maka ebubo iji akara ịhụakwụkwọ soshal midịa akwalite ụzọ na-ezighị ezi e ji akpata ego, iji ọgwụ ọtụmọọkpọ, ihiwe ụlọọgwụ adigboroja, ịkwalite ụzọ e ji enweta ego ngwa ngwa, ebubo igbu mmadụ, ime ọgwụ ọtụmọọkpọ, ịtọ mmadụ.

A malitere gụwara ya oge ọ nọ na mkpọrọ malite n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị 2026.

Akwa Ọkụkọ kwetara n'ebubo ndị e boro ya tupu ọkaikpe nye mkpebi ahụ.