Fubara edochiela ndịisioche okpuruọchịchị Rivas steeti
Aka na-achị Rivas steeti ekwuola okwu gbasara ndịisioche okpuruọchịchị steeti ahụ dịka ndị mmadụ na-enwe ụjọ.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Siminalayi Fubara nọọrọ n’ụtụtụ Tuzde 18 Juun 2024 nye iwu ka ndị isi ọrụ n’okpuruọchịchị niile e nwere na Rivas steeti malite ilekọta okpuruọchịchị ha n’otu n’otu.
Fubara nyere iwu ahụ n’ozi ọ gbasaara ndị Rivas steeti dịka oge ọchịchị ndịisioche okpuruọchịchị steeti ahụ kụụrụ ọnụ n’ụbọchị Monde 17 Juun 2024.
O mere mgbasaozi ahụ dịka ụfọdụ ndịisioche jụrụ ịhapụ ọkwa ha, bụ nke mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa gaa nọchie n’ogige ụlọọrụ okpuruọchịchị dị iche iche.
Ihe kpatara nke a bụ na ụfọdụ ndịisioche siri ọnwụ na ha agaghị ahapụ ọkwa ha n’ihi na onyeisioche ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Martin Amaewhule megharịrị iwu hiwere okpuruọchịchị ma were ọnwa isii gbatịa oge ọrụ ha.
Ka osiladị, ụlọikpe ukwu dị na Rivas steeti kachapụrụ iwu ahụ ma kwuo na iwu Naịjirịa akwadoghị ya.
Ọkaikpe Daketima Kio kwupụtara iwu ọhụrụ ahụ nyere ohere ka a gbatịa oge ọrụ ndịisioche a kpọrọ ‘Local Government Law No. 2 of 2024’ dịka nke iwu na-akwadoghị.